Jọn Nke Mbụ
1 Anyị na-ede gbasara onye wetara okwu na-enye ndụ,+ onye si ná mmalite dịrị, onye anyị nụrụ ihe o kwuru, onye anyị ji anya anyị hụ, onye anyị leruru anya ma metụ aka. 2 (N’eziokwu, e mere ka ndụ ahụ pụta ìhè. Anyị ahụla ya ma na-agba àmà ya,+ na-akọkwara unu banyere ndụ ebighị ebi ahụ+ nke si n’aka Nna anyị, nke e mere ka ọ pụta ìhè n’ebe anyị nọ.) 3 Ọ bụ ihe anyị hụrụ na ihe anyị nụrụ ka anyị na-akọrọ unu,+ ka anyị na unu wee dịrị n’otu. Ọ bụkwa otú ahụ ka anyị na Nna anyị na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị n’otu.+ 4 Anyị na-ede ihe ndị a ka ọṅụ anyị wee zuo ezuo.
5 Ihe a bụ ozi anyị nụrụ n’ọnụ ya, anyị na-ezikwa ya unu: Chineke bụ ìhè,+ e nweghịkwa ihe ọ bụla jikọrọ ya na ọchịchịrị.* 6 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị na ya dị n’otu,” ma anyị ana-eje ije n’ọchịchịrị,* anyị na-agha ụgha, ndụ anyị na-ebi adabaghịkwa n’ihe bụ́ eziokwu.+ 7 Ma ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè* otú yanwa nọ n’ìhè, anyị na ibe anyị dị n’otu, ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie niile.+
8 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị anaghị eme mmehie,” anyị na-aghọgbu onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa anyị n’ime. 9 Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile+ n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume. 10 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị emetụbeghị mmehie,” anyị na-eme ya onye ụgha, okwu ya adịghịkwa n’obi anyị.