Jenesis
16 Seraị, nwunye Ebram, amụtaraghị ya nwa.+ Ma o nwere nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi aha ya bụ Hega.+ 2 Seraị sịrị Ebram: “Lee, Jehova egbochiela m ịmụ nwa. Biko, gị na nwaanyị na-ejere m ozi nwee mmekọahụ. Ma eleghị anya, ọ ga-amụtara m ụmụ.”+ Ebram wee kweta ime ihe Seraị kwuru. 3 Mgbe Ebram bichara afọ iri na Kenan, Seraị nwunye Ebram, kpọọrọ Hega, nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi, kpọnye di ya Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. 4 Ya na Hega wee nwee mmekọahụ, Hega adịrị ime. Mgbe ọ matara na ya dị ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu anya.
5 Seraị wee sị Ebram: “Ọ bụ gị kpatara ihe ọjọọ a o mere m. Ọ bụ m kpọnyere gị nwaanyị na-ejere m ozi, ma mgbe ọ matara na ya adịla ime, ọ malitere ileda m anya. Ka Jehova kpee ikpe mụ na gị.” 6 Ebram wee sị Seraị: “Ebe ọ bụ nwaanyị na-ejere gị ozi, mee ya ihe ọ bụla masịrị gị.” Seraị wee megbuwe ya, ya esi n’ụlọ ya gbapụ.
7 Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova hụrụ Hega n’otu isi iyi dị n’ala ịkpa. Isi iyi ahụ dị n’ụzọ gawara Shọọ.+ 8 O wee sị: “Hega, nwaanyị na-ejere Seraị ozi, olee ebe i si bịa, ebeekwa ka ị na-aga?” O wee zaa, sị: “M si n’ụlọ Seraị nne m ukwu na-agbapụ.” 9 Mmụọ ozi Jehova gwara ya, sị: “Laghachikwuru nne gị ukwu, wedakwa onwe gị n’okpuru ya.” 10 Mmụọ ozi Jehova sịkwara ya: “M ga-eme ka ụmụ* gị mụbaa nke ukwuu nke na a gaghị agụta ha ọnụ n’ihi otú ha ga-esi dị ọtụtụ.”+ 11 Mmụọ ozi Jehova kwukwara, sị: “Lee, ị dị ime. Ị ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Ishmel,* n’ihi na Jehova anụla na ị na-ata ahụhụ. 12 Ma ọ ga na-eme ka jakị ọhịa.* Ọ ga na-alụso onye ọ bụla ọgụ, onye ọ bụla ga na-alụsokwa ya ogụ. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ga-eche ụmụnne ya niile ihu.”*
13 Hega wee too* aha Jehova, onye nọ na-agwa ya okwu. Ọ sịrị: “Ị bụ Chineke na-ahụ ụzọ.”+ O kwuru ihe a maka na ọ gwara onwe ya, sị: “M nọrọla ebe a hụ onye ahụ nke na-ahụ m.” 14 Ọ bụ ya mere e ji kpọọ olulu mmiri ahụ Bia-lehaị-rọị.* (Ọ dị n’agbata Kedesh na Bired.) 15 Hega wee mụọrọ Ebram nwa nwoke. Ebram wee gụọ nwa ya nwoke ahụ Hega mụụrụ ya Ishmel.+ 16 Ebram dị afọ iri asatọ na isii mgbe Hega mụụrụ ya Ishmel.