Zefanaya
1 Ihe a ka Jehova gwara Zefanaya* nwa Kọshaị nwa Gedalaya nwa Amaraya nwa Hezekaya n’oge Josaya+ nwa Emọn+ bụ eze Juda:
2 Jehova kwuru, sị, “M ga-ekpochapụ ihe niile dị n’elu ala.”+
3 Jehova kwukwara, sị, “M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ.
M ga-egbuchapụkwa ụmụ mmadụ n’elu ala.”
4 “M ga-esetị aka m mee Juda
Na ndị niile bi na Jeruselem ihe.
M ga-ekpochapụkwa ndị fọdụrụ ná ndị na-efe Bel ebe a,+
Hichapụkwa aha ndị nchụàjà chi ala ọzọ, ha na ndị nchụàjà ndị ọzọ na-ekpere arụsị.+
5 M ga-ekpochapụkwa ndị na-anọ n’elu ụlọ akpọrọ ihe ndị dị n’eluigwe* isiala,+
Nakwa ndị na-akpọrọ Jehova isiala, na-ekwe ya nkwa na ha agaghị ahapụ ya,+
Ma, ha ana-ekwekwa Malkam nkwa na ha agaghị ahapụ ya.+
6 M ga-ekpochapụkwa ndị kwụsịrị iso Jehova+
Nakwa ndị na-anaghị achọ Jehova ma ọ bụ ndị na-anaghị ajụ ase ya.”+
7 Nọrọnụ jii n’ihu Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso.+
Jehova akwadebela àjà ọ ga-achụ. O doola ndị ọ kpọrọ òkù nsọ.
8 “N’ụbọchị mụnwa bụ́ Jehova ga-achụ àjà, m ga-ata ndị isi
Na ụmụ eze+ ahụhụ, taakwa ndị niile na-eyi uwe ndị mba ọzọ ahụhụ.
9 N’ụbọchị ahụ, m ga-ata ndị niile na-arịgo n’elu ihe dị elu a na-eguzo ekwu okwu* ahụhụ,
Ndị na-eme ka e jiri tigbuo zọgbuo na ịghọ aghụghọ mara ụlọ nna ha ukwu.”
10 Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,
A ga-anụ mkpu ákwá n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+
Nụkwa ákwá a na-ebesi ike n’ebe ọhụrụ ndị mmadụ bi n’obodo a,+
Nụkwa ụda ihe ndị a na-akụpịasị n’ugwu.
E bibiela ndị niile na-atụ ọlaọcha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.
12 N’oge ahụ, m ga-eji mpanaka* nyochaa Jeruselem nke ọma.
M ga-ata ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha* ahụhụ, ndị na-asị n’obi ha,
‘Jehova agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ.’+
13 A ga-akwakọrọ akụ̀ ha, bibiekwa ụlọ ha.+
Ha ga-arụ ụlọ, ma ha agaghị ebi na ya.
Ha ga-akọkwa ubi vaịn, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ya.+
Ọ dị nso. O jikwa oké ọsọ na-abịa.+
Ụda a ga na-anụ n’ụbọchị Jehova ga-adị egwu.+
Onye agha ga-eti mkpu ákwá n’ụbọchị ahụ.+
15 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị oké iwe,+
Ụbọchị ahụhụ na nhụjuanya,+
Ụbọchị oké ifufe na ịtọgbọrọ chakoo,
Ụbọchị ọchịchịrị na itiri,+
Ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị,+
16 Ụbọchị ndị mmadụ ga-afụ opi ma tie mkpu agha+
Ka e bibie obodo ndị a rụsiri ike na ụlọ nche ndị dị n’isi isi mgbidi.+
17 M ga-akpatara ụmụ mmadụ ezigbo nsogbu.
18 Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+