Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 23
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Jehoyada nyere aka e chie Jehoash eze (1-11)

      • E gburu Atalaya (12-15)

      • Ihe ọma dị iche iche Jehoyada mere (16-21)

2 Ihe E Mere 23:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:4

2 Ihe E Mere 23:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 8:14

2 Ihe E Mere 23:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 5:3
  • +2Sa 7:8, 12; 1Ez 2:4; 9:5; Ọm 89:20, 29

2 Ihe E Mere 23:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 24:3
  • +2Ez 11:5-8; 1Ih 9:22-25; 26:1

2 Ihe E Mere 23:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:1
  • +1Ez 7:12

2 Ihe E Mere 23:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 23:28, 32

2 Ihe E Mere 23:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mgbe ọ na-apụ apụ na mgbe ọ na-abata abata.”

2 Ihe E Mere 23:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:9-12
  • +1Ih 24:1; 26:1

2 Ihe E Mere 23:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:4
  • +2Sa 8:7
  • +1Ih 26:26, 27; 2Ih 5:1

2 Ihe E Mere 23:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Chineke.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:2
  • +Di 17:18
  • +1Sa 10:1, 24

2 Ihe E Mere 23:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:13-16

2 Ihe E Mere 23:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ogidi ya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 23:1
  • +1Ez 1:39, 40

2 Ihe E Mere 23:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

2 Ihe E Mere 23:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:17, 18; 2Ih 34:1, 31

2 Ihe E Mere 23:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:27, 28
  • +Di 12:3; 2Ih 34:1, 4
  • +Di 13:5; 1Ez 18:40

2 Ihe E Mere 23:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 23:6, 30, 31
  • +Ọp 29:38; Ọg 28:2

2 Ihe E Mere 23:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 9:26; 26:1, 13

2 Ihe E Mere 23:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:9
  • +1Ez 7:7
  • +2Ez 11:19, 20

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 23:12Ez 11:4
2 Ihe 23:22Ih 8:14
2 Ihe 23:32Sa 5:3
2 Ihe 23:32Sa 7:8, 12; 1Ez 2:4; 9:5; Ọm 89:20, 29
2 Ihe 23:41Ih 24:3
2 Ihe 23:42Ez 11:5-8; 1Ih 9:22-25; 26:1
2 Ihe 23:51Ez 7:1
2 Ihe 23:51Ez 7:12
2 Ihe 23:61Ih 23:28, 32
2 Ihe 23:82Ez 11:9-12
2 Ihe 23:81Ih 24:1; 26:1
2 Ihe 23:92Ez 11:4
2 Ihe 23:92Sa 8:7
2 Ihe 23:91Ih 26:26, 27; 2Ih 5:1
2 Ihe 23:112Ez 11:2
2 Ihe 23:11Di 17:18
2 Ihe 23:111Sa 10:1, 24
2 Ihe 23:122Ez 11:13-16
2 Ihe 23:132Ih 23:1
2 Ihe 23:131Ez 1:39, 40
2 Ihe 23:162Ez 11:17, 18; 2Ih 34:1, 31
2 Ihe 23:172Ez 10:27, 28
2 Ihe 23:17Di 12:3; 2Ih 34:1, 4
2 Ihe 23:17Di 13:5; 1Ez 18:40
2 Ihe 23:181Ih 23:6, 30, 31
2 Ihe 23:18Ọp 29:38; Ọg 28:2
2 Ihe 23:191Ih 9:26; 26:1, 13
2 Ihe 23:202Ez 11:9
2 Ihe 23:201Ez 7:7
2 Ihe 23:202Ez 11:19, 20
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 23:1-21

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

23 N’afọ nke asaa, Jehoyada katara obi kpọọ ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ ha na ya agbaa ndụ. Ndị isi ahụ bụ Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohenan, Azaraya nwa Obed, Measaya nwa Adaya, na Elishefat nwa Zikraị. 2 Ha gaziri n’obodo niile dị na Juda kpọkọta ndị Livaị+ na ndị isi ọnụmara ndị dị n’Izrel. Mgbe ha gbakọrọ na Jeruselem, 3 ha na eze gbara ndụ+ n’ụlọ ezi Chineke. Mgbe ha gbachara ndụ, Jehoyada sịrị ha:

“Ihe Jehova kwere Devid ná nkwa gbasara ụmụ ya ga-eme. Ọ bụ nwa eze ga-achị.+ 4 Ihe a ka unu ga-eme: Ndị nchụàjà na ndị Livaị ga-eke onwe ha ụzọ atọ. Otu ụzọ ga-abịa ọrụ+ n’Ụbọchị Izu Ike. Ha ga na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 5 Otu ụzọ ọzọ ga-anọ n’ụlọ* eze,+ otu ụzọ ọzọ anọrọ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọzi n’ogige ndị dị n’ụlọ Jehova.+ 6 Unu ekwela ka onye ọ bụla bata n’ụlọ Jehova ma e wezụga ndị nchụàjà na ndị Livaị na-eje ozi.+ Ọ bụ ha ga-abata n’ihi na ha dị nsọ. Ndị ọzọ niile ga-anọ n’èzí na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ Jehova. 7 Ndị Livaị ga-agba eze gburugburu, onye nke ọ bụla ga-ejikwa ngwá agha ya n’aka. Gbuonụ onye ọ bụla batara n’ụlọ ahụ. Sorokwanụ eze ebe ọ bụla ọ na-aga.”*

8 Ndị Livaị na ndị Juda niile mekwara nnọọ ihe Jehoyada onye nchụàjà gwara ha. Onyeisi nke ọ bụla kpọọrọ ndị nọ n’ìgwè ya, ma ndị nke nọ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ahụ ma ndị nke na-anọghị ọrụ,+ n’ihi na Jehoyada onye nchụàjà agwabeghị ìgwè dị iche iche+ ka ha kwụsị ọrụ. 9 Jehoyada onye nchụàjà nyekwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ+ ube na ọta Eze Devid,+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke.+ 10 Ọ gwakwara mmadụ niile ebe ha ga-anọ, ha anọrọ ebe ahụ gbaa eze gburugburu, malite n’ebe aka nri ụlọ ahụ ruo n’ebe aka ekpe ya. Ha nọkwa ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ ahụ nso, onye nke ọ bụla n’ime ha jikwa ngwá agha ya n’aka. 11 Ha kpọpụtakwara nwa eze,+ kpuwe ya okpueze, dokwasịkwa Ihe Àmà*+ n’isi ya ma chie ya eze. Jehoyada na ụmụ ya tekwara ya mmanụ. Ha asị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”+

12 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ, na-eto eze, ọ bịakwutere ha ozugbo n’ụlọ Jehova.+ 13 Ọ hụkwara ka eze guzo n’akụkụ otu ogidi* nke dị ebe e si abata n’ụlọ ahụ. Ndị isi+ na ndị na-afụ opi nọkwa n’akụkụ eze. Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ+ ma na-afụ opi. Ndị ji ngwá egwú na-abụ abụ nọkwa na-edu ndị niile ahụ na-aṅụrị ọṅụ. Ihe a mere ka Atalaya dọwaa uwe ya, tie mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” 14 Ma Jehoyada onye nchụàjà kpọrọ ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ, ya bụ, ndị isi ndị agha, sị ha: “Kpọpụnụ ya ebe a unu nọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla esoro ya, jirinụ mma agha gbuo onye ahụ.” Jehoyada onye nchụàjà kwukwara, sị: “Unu egbula ya n’ụlọ Jehova.” 15 Ndị agha ahụ wee kpụrụ ya. Mgbe ha kpụ ya rute ebe a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya, nke dị n’ụlọ* eze, ha gburu ya ozugbo.

16 Jehoyada mekwara ka ya na mmadụ niile na eze gbaa ndụ na ha agaghị akwụsị ịbụ ndị Jehova.+ 17 Mgbe e mechara, mmadụ niile gara n’ụlọ Bel, kwatuo ya,+ kụriekwa ebe ndị a na-achụrụ ya àjà na arụsị ndị dị ebe ahụ.+ Ha gbukwara Matan bụ́ onye nchụàjà Bel+ n’ihu ebe ịchụàjà ndị ahụ. 18 Jehoyada nyefeziri ndị nchụàjà na ndị Livaị ọrụ ndị dị n’ụlọ Jehova. Devid adịla mbụ kee ha n’ìgwè n’ìgwè ka ha na-elekọta ụlọ Jehova, na-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ+ otú e dere n’Iwu Mosis ka a na-eme.+ Ka ha na-eme ihe ndị a, ha ga na-aṅụrị ọṅụ, na-abụkwa abụ otú Devid kwuru ka a na-eme. 19 O dowekwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova, ka onye ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụzọ ọ bụla ghara ịbanye. 20 Ọ kpọkwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ndị agha,+ ndị ukwu, ndị ọchịchị, nakwa ndị obodo ahụ niile, ha esi n’ụlọ Jehova kpọrọ eze pụwa. Ha sizi n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago bata n’ụlọ* eze, meekwa ka eze nọrọ n’ocheeze+ alaeze ahụ.+ 21 Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ. Obodo ahụ dakwara jii n’ihi na ha ejirila mma agha gbuo Atalaya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya