Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

      • Atalaya weghaara ọchịchị (1-3)

      • E chiri Jehoash eze na nzuzo (4-12)

      • E gburu Atalaya (13-16)

      • Jehoyada mere ka ihe ka mma (17-21)

2 Ndị Eze 11:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 8:26; 11:20; 2Ih 21:5, 6; 24:7
  • +2Ez 9:27
  • +2Ih 21:4; 22:10-12

2 Ndị Eze 11:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Jehoshiba bụ nwaanyị.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 12:1

2 Ndị Eze 11:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 14:27
  • +2Ih 23:1-3

2 Ndị Eze 11:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:1; 2Ih 23:4-7

2 Ndị Eze 11:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mgbe ọ na-apụ apụ na mgbe ọ na-abata abata.”

2 Ndị Eze 11:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:4
  • +2Ih 23:8-11

2 Ndị Eze 11:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 14:27
  • +1Ez 8:22; 2Ih 4:1

2 Ndị Eze 11:12

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Chineke.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:2
  • +Ọp 25:21; 31:18
  • +1Ez 1:39, 40

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/1991, p. 31

2 Ndị Eze 11:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 23:12-15

2 Ndị Eze 11:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 23:3
  • +2Ih 5:12

2 Ndị Eze 11:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:4; 2Ih 23:9

2 Ndị Eze 11:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:1

2 Ndị Eze 11:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 10:25; 2Sa 5:3
  • +2Ih 23:16, 17

2 Ndị Eze 11:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:3
  • +Di 7:25
  • +Di 13:5
  • +2Ih 23:18-21

2 Ndị Eze 11:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:4, 15
  • +1Ez 14:27
  • +2Sa 7:8, 16

2 Ndị Eze 11:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:2
  • +2Ih 24:1

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Eze 11:12Ez 8:26; 11:20; 2Ih 21:5, 6; 24:7
2 Eze 11:12Ez 9:27
2 Eze 11:12Ih 21:4; 22:10-12
2 Eze 11:22Ez 12:1
2 Eze 11:41Ez 14:27
2 Eze 11:42Ih 23:1-3
2 Eze 11:51Ez 7:1; 2Ih 23:4-7
2 Eze 11:92Ez 11:4
2 Eze 11:92Ih 23:8-11
2 Eze 11:111Ez 14:27
2 Eze 11:111Ez 8:22; 2Ih 4:1
2 Eze 11:122Ez 11:2
2 Eze 11:12Ọp 25:21; 31:18
2 Eze 11:121Ez 1:39, 40
2 Eze 11:132Ih 23:12-15
2 Eze 11:142Ez 23:3
2 Eze 11:142Ih 5:12
2 Eze 11:152Ez 11:4; 2Ih 23:9
2 Eze 11:161Ez 7:1
2 Eze 11:171Sa 10:25; 2Sa 5:3
2 Eze 11:172Ih 23:16, 17
2 Eze 11:18Di 12:3
2 Eze 11:18Di 7:25
2 Eze 11:18Di 13:5
2 Eze 11:182Ih 23:18-21
2 Eze 11:192Ez 11:4, 15
2 Eze 11:191Ez 14:27
2 Eze 11:192Sa 7:8, 16
2 Eze 11:212Ez 11:2
2 Eze 11:212Ih 24:1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ndị Eze 11:1-21

Ndị Eze nke Abụọ

11 Mgbe Atalaya+ nne Ehazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla,+ ọ gara ka o gbuo ụmụ eze niile.+ 2 Ma, Jehoshiba* nwa Eze Jehoram, nwanne Ehazaya, zooro ezoro si ebe ụmụ eze ndị nwoke a chọrọ igbu nọ kupụ Jehoash+ nwa Ehazaya. O kunyere ya nwaanyị na-enye ya ara ma kpọba ha abụọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime. Ha zoro ya ka Atalaya ghara ịhụ ya, nke mere na e gbughị ya. 3 E zoro ya n’ụlọ Jehova ruo afọ isii mgbe Atalaya nọ na-achị ndị obodo ahụ.

4 N’afọ nke asaa, Jehoyada ziri ozi, a kpọtara ya ndị isi otu narị otu narị ndị na-ahụ maka ndị nche Keria na ndị isi ndị na-eche obí eze nche,*+ ya agwa ha ka ha bịa n’ụlọ Jehova. Mgbe ha bịara n’ụlọ Jehova, ya na ha gbara ndụ, ya agwakwa ha ka ha ṅụọrọ ya iyi, ha aṅụọrọ ya iyi, ya egosizie ha nwa eze.+ 5 Ọ gwakwara ha, sị: “Ihe a ka unu ga-eme: Unu ga-eke onwe unu ụzọ atọ. Otu ụzọ ga-abịa ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ha ga-eche ụlọ*+ eze nche nke ọma. 6 Otu ụzọ ọzọ ga-anọ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ntọala, otu ụzọ ọzọ anọrọ n’ọnụ ụzọ ámá dị n’azụ ndị na-eche obí eze nche. Keenụ ndị ga-eche ụlọ ahụ nche otú ọ ga-abụ, otu ndị chechaa, ndị ọzọ echee. 7 Ka ìgwè abụọ n’ime unu, ndị na-agaghị anọ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, nọrọkwa na-eche ụlọ Jehova nche nke ọma iji chebe eze. 8 Unu ga-agba eze gburugburu, onye nke ọ bụla n’ime unu ga-ejikwa ngwá agha ya n’aka. Gbuonụ onye ọ bụla batara ebe unu nọ. Sorokwanụ eze ebe ọ bụla ọ na-aga.”*

9 Ndị isi ìgwè otu narị otu narị+ ahụ mere nnọọ ihe Jehoyada onye nchụàjà gwara ha. Onyeisi nke ọ bụla kpọọrọ ndị nọ n’ìgwè ya, ma ndị nke nọ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ahụ ma ndị nke na-anọghị ọrụ. Ha bịakwutere Jehoyada onye nchụàjà.+ 10 Jehoyada nyekwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ ube na ọta Eze Devid, ndị dị n’ụlọ Jehova. 11 Ndị na-eche obí eze nche+ gara nọrọ ebe ha na-anọ, malite n’ebe aka nri ụlọ ahụ ruo n’ebe aka ekpe ya. Ha nọkwa ebe ịchụàjà+ na ụlọ nsọ ahụ nso, gbaa eze gburugburu, onye nke ọ bụla n’ime ha jikwa ngwá agha ya n’aka. 12 Jehoyada kpọpụtakwara nwa eze,+ kpuwe ya okpueze, dokwasị Ihe Àmà*+ n’isi ya, chie ya eze ma tee ya mmanụ. Ha malitekwara ịkụ aka, na-asị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”+

13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ, ọ bịakwutere ha ozugbo n’ụlọ Jehova.+ 14 Ọ hụkwara ka eze guzo n’akụkụ otu ogidi otú ha si eme+ ma e chiwe mmadụ eze. Ndị isi na ndị na-afụ opi+ nọkwa n’akụkụ eze. Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ ma na-afụ opi. Ihe a mere ka Atalaya dọwaa uwe ya, tie mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” 15 Ma Jehoyada onye nchụàjà gwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị+ ahụ, ya bụ, ndị isi ndị agha, sị: “Kpọpụnụ ya ebe a unu nọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla esoro ya, jirinụ mma agha gbuo onye ahụ.” Jehoyada onye nchụàjà kwukwara, sị: “Unu egbula ya n’ụlọ Jehova.” 16 Ndị agha ahụ wee kpụrụ ya. Mgbe ha kpụ ya rute ebe ịnyịnya si abanye n’ụlọ* eze,+ ha gburu ya.

17 Jehoyada mekwara ka Jehova na eze na mmadụ niile+ gbaa ndụ na ha agaghị akwụsị ịbụ ndị Jehova. O mekwara ka eze na mmadụ niile+ gbaa ndụ. 18 Mgbe e mechara, ndị obodo ahụ niile gara n’ụlọ Bel, kwatuo ebe dị iche iche a na-achụrụ ya àjà,+ kụriekwa arụsị ndị dị ebe ahụ.+ Ha gbukwara Matan bụ́ onye nchụàjà Bel+ n’ihu ebe ịchụàjà ndị ahụ.

Jehoyada onye nchụàjà họpụtakwara ndị ga na-elekọta ụlọ Jehova.+ 19 Ọ kpọkwaara ndị isi ìgwè otu narị otu narị+ ndị agha, ndị nche Keria, ndị na-eche obí eze nche,+ na ndị obodo ahụ niile, ka ha si n’ụlọ Jehova dulaa eze n’ụlọ* ya. Ha sikwa ụzọ e si aga n’ọnụ ụzọ ámá ndị na-eche obí eze nche dulaa ya n’ụlọ eze. Ọ gakwara nọrọ n’oche ndị eze na-anọ.+ 20 Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ. Obodo ahụ dakwara jii n’ihi na ha ejirila mma agha gbuo Atalaya n’ụlọ eze.

21 Jehoash+ dị afọ asaa mgbe ọ malitere ịchị.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya