Abụ Ọma
Ekpere Devid.
17 Jehova, biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ ka e kpee m ikpe ziri ezi.
Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.
Gee ntị n’ekpere m, nke m na-ejighị aghụghọ ekpe.+
2 Biko, kpebie ihe ziri ezi nke ga-abara m uru.+
Biko, ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
3 I nyochaala obi m. I leruola m anya n’abalị.+
Ị nụchaala m.+
Ị ga-achọpụta na e nweghị nkata ọjọọ m kpara,
Ejighịkwa m ọnụ m kwuo ihe ọjọọ.
6 Chineke, m na-akpọ gị ka i nyere m aka maka na ị ga-aza m.+
Gee m ntị.* Nụrụ ihe m na-ekwu.+
7 Gị Onye na-azọpụta ndị na-agbaba n’aka gị siri ike,*
Onye na-azọpụta ha n’aka ndị na-enupụrụ gị isi,
Biko, mee ihe dị ebube iji gosi ịhụnanya gị.+
Zoo m n’okpuru nku gị.+
9 Napụta m n’aka ndị ajọ omume ndị na-alụso m ọgụ,
N’aka ndị iro m gbara m gburugburu ma na-achọ igbu m.+
10 Ihe anaghịzi emetụ ha n’ahụ́.*
Ha na-etu ọnụ.
11 Ugbu a, ha agbaala anyị gburugburu.+
Ha na-ele anyị anya ka ha chọta ohere ha ga-eji eme ka anyị daa.
12 Onye ajọ omume dị ka ọdụm chọrọ ịdọri anụ,
Ka ọdụm makpu n’ebe zoro ezo.
13 Jehova, biko, bilie lụso ya ọgụ+ ma merie ya.
Jiri mma agha gị napụta m* n’aka onye ajọ omume.
14 Jehova, biko, jiri aka gị napụta m
N’aka ndị nọ n’ụwa a,* ndị ihe ha ketara bụ ndụ ha dị ugbu a,+
Ndị i ji ihe ọma ndị ị na-enye ndị mmadụ eme ka afọ ju,+
Ndị na-ahapụrụ ọtụtụ ụmụ ha mụrụ akụ̀ ha ga-eketa.
15 Ma ezi omume m na-eme ga-eme ka m hụ ihu gị.
Obi na-atọ m ụtọ ma m teta hụ na ị nọnyeere m.+