Ezikiel
36 “Nwa nke mmadụ, buo amụma banyere ugwu ndị dị n’Izrel. Kwuo, sị, ‘Ugwu ndị dị n’Izrel, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 2 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị iro unu kwuru gbasara unu, sị, ‘Ntọọ! Ọ bụ anyị nwezi ebe ndị dị elu dị kemgbe oge ochie.’”’+
3 “N’ihi ya, buo amụma, sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “E meela ka unu tọgbọrọ chakoo, e sikwa n’akụkụ niile lụso unu agha, nke mere ka ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche chọwa ka unu bụrụ nke ha, nke mekwara ka ndị mmadụ jiri ọnụ na-eme unu ihe, na-akọkwa akụkọ ọjọọ banyere unu.+ 4 N’ihi ihe a ha mere, ugwu niile dị n’Izrel, nụrụnụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. E nwere ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ugwu ukwu na ugwu nta, iyi na ndagwurugwu, na ebe ndị a lara n’iyi, ndị tọgbọzi nkịtị,+ nakwa obodo niile na-enweghịzi ndị bi na ha, ndị a kwakọọrọ ihe dị na ha, ndị ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche gbara ha gburugburu na-akwa emo.+ 5 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ha, sị: ‘M ga-eji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi+ kwuo ihe ga-eme ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche nakwa ihe ga-eme ndị Ịdọm niile. Ha niile na-akwa m emo. Obi bụkwa ha sọ aṅụrị+ ka ha na-eweghara ala m. Ha na-achọkwa iweghara ebe dị iche iche anụmanụ na-ata ahịhịa na ya, na-achọkwa ịkwakọrọ ihe ndị dị n’ala m.’”’+
6 “N’ihi ya, buo amụma banyere ala Izrel, gwakwa ugwu ukwu na ugwu nta, nakwa iyi na ndagwurugwu, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-eji iwe na ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu, n’ihi na mba dị iche iche emenyela unu ihere.”’+
7 “Ọ bụ ya mere Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ji kwuo, sị: ‘Eweliela m aka m elu ṅụọ iyi na ihere ga-eme mba ndị gbara unu gburugburu.+ 8 Ma, ununwa bụ́ ugwu niile dị n’Izrel, a ga-enwe osisi ndị ga-awa ọtụtụ alaka n’elu unu, ha ga-amịkwa mkpụrụ ndị Izrel bụ́ ndị m ga-ata,+ n’ihi na ọ gaghị ete aka ha alọta. 9 Ihe a ga-eme maka na m nọnyeere unu. M ga-echekwa ihu n’ebe unu nọ. A ga-akọ ihe n’elu unu, ghaakwa mkpụrụ n’elu unu. 10 M ga-eme ka ndị Izrel dị ọtụtụ n’elu unu, ya bụ, ndị Izrel niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa n’obodo ndị dị n’Izrel.+ A ga-arụghachikwa ebe ndị ahụ a lara n’iyi.+ 11 N’eziokwu, m ga-eme ka mmadụ na anụmanụ dị ọtụtụ n’elu unu.+ Ha ga-ehi nne, mụọkwa ụmụ. M ga-emekwa ka e biri n’elu unu otú ọ dị n’oge mbụ.+ M ga-emekwa ka ihe gaziere unu ugbu a karịa n’oge gara aga.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.+ 12 M ga-eme ka ndị Izrel, bụ́ ndị m, biri n’elu unu. Unu ga-abụ nke ha.+ Unu ga-abụkwa ihe ha ketara. E nweghịkwa ihe ga-eme ka unu gbawa ha aka ụmụ ọzọ.’”+
13 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘E nwere ndị na-asị unu: “Unu bụ ala na-eri ndị mmadụ, na-agbawakwa mba nwe ya aka ụmụ.”’ 14 ‘N’ihi ya, unu agaghịzi na-eri mmadụ. Unu agaghịkwa na-agbawa mba nwe unu aka ụmụ.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 15 ‘M gaghịzi ekwe ka mba dị iche iche kparịa unu ọzọ. M gaghịkwa ekwe ka ndị mmadụ kwawa unu emo.+ Unu agaghịzi akpatara mba nwe unu ọdachi.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
16 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 17 “Nwa nke mmadụ, mgbe ndị Izrel bi n’ala ha, ha ji àgwà ha na omume ha merụọ ya.+ N’anya m, ihe ndị ha nọ na-eme mere ka ha ghara ịdị ọcha otú ahụ nwaanyị nọ ná nsọ ya na-adịghị ọcha.+ 18 N’ihi ya, m ji iwe mee ha ihe maka ndị ha gburu* n’ala ha+ nakwa n’ihi na ha ji arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi* merụọ ala a.+ 19 M chụgara ha ná mba dị iche iche, chụsasịakwa ha n’ala dị iche iche.+ M kpere ha ikpe maka ihe ha mere na otú ha si kpaa àgwà. 20 Ma mgbe ha batara ná mba dị iche iche, ndị mmadụ nọ na-emebi aha nsọ m,+ n’ihi na ha na-ekwu banyere ndị m, sị, ‘Ndị a bụ ndị Jehova, mana ha ebighịzi n’ala ya.’ 21 M ga-eji maka aha nsọ m ghara ịgbachi nkịtị, ya bụ, aha m ndị Izrel nọ na-emebi ná mba dị iche iche ha nọ.”+
22 “N’ihi ya, gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Ndị Izrel, ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eji mee ihe m ga-eme. Kama, ọ bụ n’ihi aha nsọ m nke unu mebiri ná mba dị iche iche unu nọ.”’+ 23 ‘M ga-eme ka mmadụ niile mara na aha m nke dị ebube dị nsọ,+ ọ bụ eziokwu na unu mere ka mba dị iche iche mebie ya. Mgbe m ga-eji unu mee ka mba niile mara na m dị nsọ, ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 24 M ga-esi ná mba ndị ahụ kpọpụta unu, sikwa n’ala niile kpọkọta unu, kpọlatakwa unu n’ala unu.+ 25 M ga-efesa unu mmiri dị ọcha. Unu ga-adịkwa ọcha.+ M ga-asachapụ ihe niile mere ka unu ghara ịdị ọcha,+ wepụchaakwa arụsị niile na-asọ oyi unu na-efe.+ 26 M ga-eme ka unu nwee otu obi,+ meekwa ka mmụọ m na-akpa ike n’ahụ́ unu.+ M ga-eme ka unu gharazie inwe obi nkume+ ma mee ka obi unu dị nro.* 27 M ga-enye unu mmụọ nsọ m. M ga-emekwa ka unu na-eso ntụziaka m.+ Unu ga na-emekwa ihe m kpebiri ka unu na-eme. 28 Unu ga-ebi n’ala ahụ m nyere nna nna unu hà. Unu ga-abụkwa ndị m, mụnwa abụrụ Chineke unu.’+
29 “‘M ga-asachapụ ihe niile mere ka unu ghara ịdị ọcha. M ga-akpọ nri òkù, meekwa ka o hie nne. Agaghịkwa m eme ka ụnwụ dịrị n’ala unu.+ 30 M ga-eme ka mkpụrụ osisi hie nne, meekwa ka ala na-eme nri otú dị mma. Ihe a ga-eme ka a gharazie inwe mgbe mba dị iche iche ga-akparị unu n’ihi ụnwụ.+ 31 N’oge ahụ, unu ga-echeta ihe ọjọọ unu nọ na-eme nakwa omume unu na-adịghị mma. Onwe unu ga na-asọkwa unu oyi n’ihi mmehie unu nakwa n’ihi arụ niile unu kpara.+ 32 Ma, burunụ ihe a n’obi: Ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eji eme ihe a.+ Ndị Izrel, ihere mee unu, ihere megbuokwa unu.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
33 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘N’ụbọchị m ga-asachapụ mmehie unu niile, m ga-eme ka unu biri n’obodo unu.+ A ga-arụghachikwa ebe ndị ahụ a lara n’iyi.+ 34 A ga-emecha kọwa ihe n’ala onye ọ bụla na-agafe ya na-ahụ na ọ tọgbọ nkịtị. 35 Ndị mmadụ ga-asịkwa: “Ala nke tọgbọbu nkịtị dịzi ka ogige Iden.+ Obodo ndị ahụ bụ́bu ikpo nkume, ndị tọgbọkwa nkịtị, ndị a kụturu ụlọ ndị dị na ha akụtu, bụzi ebe a rụsiri ike. Ndị mmadụ ebirikwala na ha.”+ 36 Mba ndị ga-afọdụ gburugburu unu ga-amara na mụnwa, bụ́ Jehova, arụghachila ụlọ ndị a kụturu akụtu, nakwa na m kụrụ ihe n’ala tọgbọbu nkịtị. Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a, meekwa ya.’+
37 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-achọ ka ndị Izrel rịọ m ka m mee ka ha hie nne ka ìgwè ewu na atụrụ. 38 M ga-emekwa ka ha dị ka ìgwè ndị dị nsọ, dịkwa ka ìgwè ewu na atụrụ na-adị na Jeruselem* n’oge ememme.+ Ndị mmadụ ga-eju ebe niile n’obodo ndị bụ́bu ikpo nkume.+ Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”