Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Job JOB IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Job bara ọgaranya, na-akwụwa aka ọtọ (1-5) Setan kwuru na ọ bụghị n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke (6-12) Akụnụba Job lara n’iyi, ụmụ ya anwụọkwa (13-19) Job ataghị Chineke ụta (20-22) 2 Setan kwuru ọzọ na ọ bụghị n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke (1-5) A hapụrụ Setan ka o mee ka Job rịawa ọrịa (6-8) Nwunye Job sịrị: “Kpọọ Chineke iyi nwụọ” (9, 10) Ndị enyi Job atọ bịara (11-13) 3 Job bụrụ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ (1-26) Ọ jụrụ ihe mere o ji na-ata ahụhụ (20, 21) 4 Okwu mbụ Elifaz kwuru (1-21) O kwuru na aka Job adịghị ọcha (7, 8) Ihe otu mmụọ gwara ya (12-17) ‘Chineke atụkwasịghị ndị ohu ya obi’ (18) 5 Elifaz ka na-ekwu okwu mbụ ya (1-27) ‘Chineke na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha’ (13) ‘Ajụla aka ná ntị Chineke na-adọ gị’ (17) 6 Job sara ihe a gwara ya (1-30) O kwuru na ákwá ọ na-ebe ziri ezi (2-6) Ndị bịara ịkasi ya obi na-aghọ ya aghụghọ (15-18) “Eziokwu anaghị afụ ụfụ” (25) 7 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-21) Ndụ mmadụ dị ka ebe a manyere ya ịrụ ọrụ ike (1, 2) “Gịnị mere o ji bụrụ m ka i lekwasịrị anya?” (20) 8 Okwu mbụ Bildad kwuru (1-22) Ọ sịrị na ọ ga-abụ na ụmụ Job mehiere (4) ‘Ọ bụrụ na ị na-eme ezi omume, Chineke ga-echebe gị’ (6) Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job anaghị asọpụrụ Chineke (13) 9 Job sara ihe a gwara ya (1-35) Mmadụ efu enweghị ike ịrụ Chineke ụka (2-4) ‘Chineke na-eme ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta’ (10) Mmadụ enweghị ike ịsa Chineke okwu (32) 10 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-22) ‘Gịnị mere Chineke ji esesa m okwu?’ (2) Chineke adịghị ka Job, bụ́ mmadụ efu (4-12) ‘Ka m kurutụ ume’ (20) 11 Okwu mbụ Zofa kwuru (1-20) Ọ sịrị na okwu Job abaghị uru (2, 3) Ọ gwara Job ka o sepụ aka n’ihe ọjọọ (14) 12 Job sara ihe a gwara ya (1-25) “Unu akaghị m” (3) “Abụrụla m onye ndị enyi ya ji eme ihe ọchị” (4) ‘Chineke nwere amamihe’ (13) Chineke karịrị ndị ikpe na ndị eze (17, 18) 13 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-28) ‘Ọ ga-akara m mma ka m gwa Chineke okwu’ (3) “Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru” (4) “Ama m na aka m dị ọcha” (18) Ọ jụrụ ihe mere Chineke ji were ya ka onye iro (24) 14 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-22) Mmadụ anaghị ebite ndụ aka, nsogbu na-ezukwa ya ahụ́ (1) “Osisi nwedịrị olileanya” (7) “A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili” (13) “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” (14) Ọrụ aka Chineke ga-agụ ya agụụ (15) 15 Okwu nke abụọ Elifaz kwuru (1-35) O kwuru na Job anaghị atụ egwu Chineke (4) O kwuru na Job dị mpako (7-9) ‘Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi’ (15) ‘Ọ bụ onye ajọ omume na-ata ahụhụ’ (20-24) 16 Job sara ihe a gwara ya (1-22) “Kama unu ga-akasi m obi, unu na-akpatakwuru m nsogbu” (2) O kwuru na Chineke lekwasịrị ya anya ka ọ taa ya ahụhụ (12) 17 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-16) “Ndị na-akwa mmadụ emo gbara m gburugburu” (2) “O meela ka m bụrụ onye ndị mmadụ ji eme ihe ọchị” (6) “M ga-agazi biri n’ili” (13) 18 Okwu nke abụọ Bildad kwuru (1-21) O kwuru ihe na-eme ndị ajọ omume (5-20) Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job amaghị Chineke (21) 19 Job sara ihe a gwara ya (1-29) Job weere mba ndị enyi ya baara ya ka ihe na-enweghị isi (1-6) Ọ sịrị na a hapụla ya (13-19) “Onye mgbapụta m dị ndụ” (25) 20 Okwu nke abụọ Zofa kwuru (1-29) O kwuru na Job kparịrị ya (2, 3) Ọ sịrị na ọ ga-abụ na Job bụ onye ajọ omume (5) O kwuru na ihe ọjọọ na-atọ Job ụtọ (12, 13) 21 Job sara ihe a gwara ya (1-34) ‘Gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ omume?’ (7-13) O kwuru na ndị na-akasi ya obi ebughị ezigbo ihe n’obi (27-34) 22 Okwu nke atọ Elifaz kwuru (1-30) “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke?” (2, 3) O kwuru na Job dị anyaukwu nakwa na o mesiri ndị ọzọ ike (6-9) ‘Lọghachikwuru Chineke ka ihe dịrị gị ná mma’ (23) 23 Job sara ihe a gwara ya (1-17) Ọ chọrọ ịnọ n’ihu Chineke kwuo otú o si bụrụ na aka ya dị ọcha (1-7) O kwuru na ya ahụghị Chineke (8, 9) ‘Ahapụghị m ụzọ ya gawa ebe ọzọ’ (11) 24 Job ka na-asa ihe a gwara ya (1-25) ‘Gịnị mere na Chineke ekpebibeghị oge ọ ga-ekpe ikpe?’ (1) O kwuru na Chineke kwere ka ihe ọjọọ na-eme (12) Ndị mmehie hụrụ ọchịchịrị n’anya (13-17) 25 Okwu nke atọ Bildad kwuru (1-6) ‘Olee otú mmadụ ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke?’ (4) O kwuru na mmadụ ịkwụwa aka ọtọ abaghị uru (5, 6) 26 Job sara ihe a gwara ya (1-14) “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị” (1-4) ‘E nweghị ihe Chineke kokwasịrị ụwa na ya’ (7) ‘Naanị obere ihe n’ihe ndị Chineke na-eme’ (14) 27 Job kpebiri na ya ga-ejisi Chineke aka ike (1-23) “Agaghị m ahapụ ịkwụsi ike n’ebe Chineke nọ” (5) Onye na-anaghị asọpụrụ Chineke enweghị olileanya (8) “Gịnị mere na okwu unu enweghị isi na ọdụ?” (12) Onye ajọ omume na-emecha gbara aka (13-23) 28 Job kwuru ihe dị iche n’amamihe na akụ̀ ndị dị n’ala (1-28) Mbọ mmadụ na-agba ka o gwupụta akụ̀ ndị dị n’ala (1-11) Amamihe bara uru karịa nkume pel (18) Ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe (28) 29 Job chetara oge ihe dịịrị ya ná mma (1-25) A na-akwanyere ya ùgwù n’ọnụ ụzọ ámá obodo (7-10) Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi (11-17) Onye ọ bụla na-ege ntị na ndụmọdụ ya (21-23) 30 Job kwuru otú ihe si gbanweere ya (1-31) O kwuru na ndị na-abaghị uru na-akwazi ya emo (1-15) Ọ dị ya ka Chineke anaghị enyere ya aka (20, 21) “Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji” (30) 31 Job kwuru ihe gosiri na ya na-akwụwa aka ọtọ (1-40) “Mụ na anya m agbaala ndụ” (1) Ọ sịrị ka Chineke jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ya (6) Ọ naghị agba n’èzí (9-12) Ọ hụghị ego n’anya (24, 25) Ọ naghị ekpere arụsị (26-28) 32 Elaịhu tinyere ọnụ n’ihe a na-ekwu (1-22) O wesara Job na ndị enyi Job iwe (2, 3) O cheere ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya ekwuwe (6, 7) Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe (9) Ọ na-enu Elaịhu enu ikwu okwu (18-20) 33 Elaịhu baara Job mba maka na ọ na-ekwu na ya bụ onye ezi omume (1-33) A hụrụ ihe mgbapụta (24) Ka o nweghachi ike okorobịa (25) 34 Elaịhu kwuru na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi (1-37) Job sịrị na Chineke kpere ya ikpe mkpegbu (5) Ezi Chineke anaghị eme ihe ọjọọ (10) Job amaghị ihe ọ na-ekwu (35) 35 Elaịhu gosiri na ihe Job na-ekwu ekwesịghị ekwesị (1-16) Job sịrị na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke (2) Chineke nọ n’eluigwe, e nweghị ihe mmehie na-eme ya (5, 6) Job kwesịrị ichere Chineke (14) 36 Elaịhu kwuru otú Chineke si dị ukwuu (1-33) Ihe na-agaziri ndị na-erube isi, ma a na-ajụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke (11-13) “È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi?” (22) Job kwesịrị ịja Chineke mma (24) “Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata” (26) Chineke na-eduzi mmiri ozuzo na àmụ̀mà (27-33) 37 Ihe ndị Chineke kere na-egosi na ọ dị ukwuu (1-24) Chineke nwere ike ịkwụsị ọrụ mmadụ na-arụ (7) “Chebara ọrụ dị ebube Chineke na-arụ echiche” (14) Ndị mmadụ enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Chineke (23) Mmadụ ọ bụla ekwesịghị iche na ya ma ihe (24) 38 Jehova gosiri na mmadụ erughị ihe ọ bụla (1-41) ‘Ebee ka ị nọ mgbe e kere ụwa?’ (4-6) Ụmụ Chineke tiri mkpu otuto (7) Ajụjụ ndị a jụrụ Job gbasara ihe ndị e kere eke (8-32) “Iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe” (33) 39 Chineke ji anụmanụ ndị o kere gosi na e nweghị ihe mmadụ ma (1-30) Ewu ọhịa na ele (1-4) Jakị ọhịa (5-8) Atụ́ (9-12) Enyí nnụnụ (13-18) Ịnyịnya (19-25) Agụ nkwọ na ugo (26-30) 40 Ajụjụ ndị Jehova jụkwuru Job (1-24) Job kwuru na e nweghị ihe ọzọ ya ga-ekwu (3-5) “Ị̀ ga-asị na anaghị m ekpe ikpe ziri ezi?” (8) Chineke kọwara ụdị ike Enyí Mmiri nwere (15-24) 41 Chineke kwuru otú Agụ Iyi si dị egwu (1-34) 42 Ihe Job sara Jehova (1-6) A baara ndị enyi Job atọ mba (7-9) Jehova mere ka Job bụrụkwa ọgaranya (10-17) Ụmụ Job ndị nwoke na ndị nwaanyị (13-15)