Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ekliziastis EKLIZIASTIS IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Ihe niile bụ ihe efu (1-11) Ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi (4) Anyanwụ anaghị akwụsị ịwa, ifufe anaghị akwụsị ife (5-7) E nweghị ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’ụwa (9) Amamihe mmadụ enweghị ebe o ruru (12-18) Ihe niile bụ ịchụ ifufe (14) 2 Solomọn chebaara mbọ ọ gbara echiche (1-11) Amamihe mmadụ abachaghị uru (12-16) Otú ịrụsi ọrụ ike si bụrụ ihe efu (17-23) Rie ihe, ṅụọ mmanya, kporiekwa ndụ n’ihi ọrụ gị (24-26) 3 E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla (1-8) Inwe obi ụtọ bụ onyinye si n’aka Chineke (9-15) Ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ (11) Chineke na-ekpe mmadụ niile ikpe ziri ezi (16, 17) Ma mmadụ ma anụmanụ na-emecha nwụọ (18-22) Ha niile ga-alaghachi n’ájá (20) 4 Ndị nwụrụ anwụ ka ndị a na-emegbu emegbu mma (1-3) Otú e kwesịrị isi na-arụ ọrụ (4-6) Uru enyi bara (7-12) Abụọ dị mma karịa otu (9) Ndụ eze nwere ike ịbụ ihe efu (13-16) 5 Tụọ egwu Chineke (1-7) Ndị isi na-ahụ ihe ndị nọ n’okpuru ha na-eme (8, 9) Akụnụba abaghị uru (10-20) Ego anaghị eju ndị hụrụ ego n’anya afọ (10) Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ (12) 6 Mmadụ inwe akụnụba ma ghara ikpori ndụ (1-6) Jiri ihe ndị i nwere na-eme onwe gị obi ụtọ (7-12) 7 Ezigbo aha; ụbọchị mmadụ nwụrụ (1-4) Mba onye ma ihe na-abara mmadụ (5-7) Njedebe dị mma karịa mmalite (8-10) Uru amamihe bara (11, 12) Ụbọchị ọma na ụbọchị ọjọọ (13-15) Abụla onye oké ezi omume (16-22) Ihe onye mkpọkọta chọpụtara (23-29) 8 Ọchịchị ụmụ mmadụ ezughị okè (1-17) Debe iwu eze (2-4) Ndị mmadụ na-achịgbu ibe ha (9) Mgbe a na-emeghị ndị ọjọọ ihe e kwesịrị ime ha (11) Rie ihe, ṅụọ mmanya, nweekwa obi ụtọ (15) 9 Otu ihe na-eme mmadụ niile (1-3) Kporie ndụ n’agbanyeghị na mmadụ na-anwụ anwụ (4-12) Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla (5) E nweghị ihe mmadụ nwere ike ime n’ili (10) Oge ọjọọ na ihe ndị a na-atụghị anya ha (11) A naghị eji amamihe akpọrọ ihe mgbe niile (13-18) 10 Obere nzuzu na-eme ka e were mmadụ ka onye na-amaghị ihe (1) Nsogbu amaghị ihe na-akpata (2-11) Nsogbu ndị na-abịara onye nzuzu (12-15) Nsogbu ndị na-achị achị na-akpata (16-20) Nnụnụ nwere ike ime ka a nụ ihe i kwuru (20) 11 Na-eme ihe ọma mgbe niile (1-8) Tụpụ achịcha gị n’elu mmiri (1) Ghaa mkpụrụ malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede (6) Ṅụrịa ọṅụ n’oge ị na-eto eto (9, 10) 12 Cheta Onye Ukwu kere gị tupu i mee agadi (1-8) Isi ihe onye mkpọkọta kwuru (9-14) Okwu ndị ma ihe dị ka ndụdụ e ji achị ehi (11) Tụọ egwu ezi Chineke(13)