Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Malakaị MALAKAỊ IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Jehova hụrụ ndị ya n’anya (1-5) Ndị nchụàjà ji ihe ndị na-adịghị mma achụ àjà (6-14) A ga-asọpụrụ aha Chineke ná mba niile (11) 2 Ndị nchụàjà akụzirighị ndị mmadụ ihe (1-9) Egbugbere ọnụ ndị nchụàjà kwesịrị ịkụziri ndị mmadụ gbasara Chineke (7) Ndị mmadụ na-agba alụkwaghịm na-ekwesịghị ekwesị (10-17) ‘“M kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru’ (16) 3 Ezigbo Onyenwe unu ga-abịa ime ka ụlọ nsọ ya dị ọcha (1-5) Onye ozi nke ọgbụgba ndụ (1) Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (6-12) Jehova anaghị agbanwe agbanwe (6) “Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu” (7) ‘Wetanụ otu ụzọ n’ụzọ iri, Jehova ga-awụsakwa unu ngọzi’ (10) Onye ezi omume na onye ajọ omume (13-18) E dere aha ndị Chineke ga-echeta n’akwụkwọ (16) Ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume (18) 4 Ịlaịja ga-abịa tupu ụbọchị Jehova abịa (1-6) ‘Anyanwụ ezi omume ga-acha’ (2)