Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt p. 39
  • Okwu Mmalite

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Mmalite
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Okwu Mmalite

OKWU MMALITE

Baịbụl Nsọ bụ akwụkwọ Chineke ji agwa anyị niile okwu. Anyị chọọ ịma gbasara Chineke, Onye e dere uche ya na Baịbụl, anyị ga-amụrịrị Baịbụl. (Jọn 17:3; 2 Timoti 3:16) Ihe e dere na ya bụ ihe Jehova Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ na ụwa ha bi na ya.—Jenesis 3:15; Mkpughe 21:3, 4.

E nweghị akwụkwọ ọzọ na-akpa ike ná ndụ ndị mmadụ ka Baịbụl. Ọ na-akụziri anyị ka anyị na-akpa àgwà ka Jehova, ya bụ, ka ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi, ka anyị hụ ha n’anya ma na-emere ha ebere. Ihe e dere na ya na-eme ka mmadụ nwee olileanya, na-enyekwara mmadụ aka idi nsogbu dị iche iche na-abịara ya, ọ bụrụgodị nsogbu siri ezigbo ike. Ọ na-emekwa ka a mata ihe ndị e ji mara ụwa a, bụ́ ihe ndị na-anaghị amasị Chineke.—Abụ Ọma 119:105; Ndị Hibru 4:12; 1 Jọn 2:15-17.

Asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl bụ Hibru, Arameik, na Grik. Ma, a sụgharịala ya n’ihe dị ka puku asụsụ atọ (3,000), ma nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik ma nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik. E nwetụbeghị akwụkwọ hụrụ azụ ya anya ma a bịa n’asụsụ ole a sụgharịrịla ya nakwa mmadụ ole nwere ya. Otú a ka o kwesịrị ịdị n’ihi na Baịbụl buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke [bụ́ tụụ bụ́ isi opi n’ihe Baịbụl na-akụzi] n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

Anyị ghọtara na ihe Baịbụl na-ekwu dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere anyị ji saa anya na mmiri sụgharịa Baịbụl a ka ya na Baịbụl mbụ e si n’ike mmụọ nsọ dee na-ekwu otu ihe, ka ọ dị mfe nghọta ma dị mfe ọgụgụ. N’azụ azụ Baịbụl a, ị ga-ahụ isiokwu ndị a: “Ihe Ndị E Kwesịrị Iburu n’Uche Mgbe A Na-asụgharị Baịbụl,” “Ihe Ndị E Degharịrị na Baịbụl A,” na “Otú Anyị Si Nweta Baịbụl.” Isiokwu ndị a kwuru gbasara ihe ụfọdụ e degharịrị na Baịbụl a.

Ọ na-amasị ndị hụrụ Jehova Chineke n’anya ma na-efe ya ịgụ Okwu Chineke a sụgharịrị nke ọma, nke dịkwa mfe nghọta. (1 Timoti 2:4) Ọ bụ ya mere anyị ji wepụta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a e degharịrị edegharị n’asụsụ Igbo. Anyị bukwa n’obi ịsụgharịkwu ya n’asụsụ ole ọ bụla ọzọ kwere anyị omume. Onye anyị hụrụ n’anya, obi siri anyị ike na ịgụ Baịbụl a ga-abara gị uru ná mbọ ị na-agba ‘ka ị chọọ Chineke ma chọta ya.’—Ọrụ Ndịozi 17:27.

Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya