NEHỌM
1 Ihe Chineke kpebiri ime Ninive:+ Akwụkwọ e dere ọhụụ Nehọm,* onye Elkọsh:
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ Ọ na-abọkwa ọbọ.
Jehova na-abọ ọbọ, na-ewekwa iwe.+
Jehova na-ata ndị iro ya ahụhụ.
Ọ na-ewesokwa ndị iro ya iwe.
3 Jehova anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ike ya dịkwa ukwuu.+
Ma Jehova agaghị ahapụ ịta onye mere mmehie ahụhụ kwesịịrị ya.+
Ụzọ ya dị n’ifufe nke na-ebibi ihe nakwa n’oké ifufe mmiri.
Ígwé ojii dịkwa ka uzuzu nke ụkwụ ya bọliri.+
4 Ọ na-abara oké osimiri mba,+ meekwa ka ọ taa.
Ọ na-eme ka osimiri niile taa.+
Beshan na Kamel na-akpọnwụ,+
Okooko Lebanọn na-akpọnwụkwa.
5 Ugwu ukwu na-ama jijiji n’ihi ya.
Ugwu nta na-agbazekwa.+
Ụwa ga-ama jijiji n’ihi ihu ya.
Ala na ndị niile bi na ya ga-amakwa jijiji.+
6 Ònye ga-eguzoli ma iwe wee ya?+
Ònyekwa ga-eguzoli ma o bido iwe iwe?+
Ọnụma ya ga-enwu ka ọkụ.
A ga-akwatusịkwa oké nkume n’ihi ya.
7 Jehova dị mma.+ Ọ bụ ebe mgbaba n’ụbọchị nsogbu.+
Ọ ma* ndị na-agbaba n’ime ya.+
8 Ọ ga-eji idei mmiri nke na-asọ asọ kpochapụ Ninive.*
Ọchịchịrị ga-achụkwa ndị iro ya ọsọ.
9 Gịnị ka unu ga-agba izu ka unu mee Jehova?
Ọ ga-ebibi unu kpamkpam.
Ahụhụ agaghị adị nke ugboro abụọ.*+
10 N’ihi na ha na-agbakụ onwe ha dị ka osisi ogwu.
Ha dịkwa ka ndị mmanya* na-egbu.
Ma a ga-akpọ ha ọkụ dị ka okporo ọka kpọnwụrụ akpọnwụ.
11 Onye na-agba izu ka o mee Jehova ihe ọjọọ ga-esi n’ime gị pụta,
Ọ ga-enyekwa ndụmọdụ na-abaghị uru.
12 Jehova kwuru, sị:
“N’agbanyeghị na ha siri ezigbo ike, dịkwa ọtụtụ,
A ga-egbutu ha. Ha agaghịzikwa adị.*
Ataala m gị* ahụhụ, ma, agaghị m ata gị ahụhụ ọzọ.
13 M ga-agbaji osisi o ji ebu ihe nke dị n’ubu gị.+
M ga-adọbikwa agbụ e kere gị.
M ga-ebibi arụsị ndị a pịrị apị na ndị nke a kpụrụ akpụ n’ụlọ* chi gị niile.
M ga-egwu ili gị, n’ihi na ị baghị uru ọ bụla.’
15 Onye na-ezi ozi ọma si n’ugwu na-abịa.
Onye ahụ na-ekwu na udo adịla.+
Juda, mee ememme gị dị iche iche.+ Kwụọ ihe i kwere ná nkwa,
N’ihi na onye na-abaghị uru agaghị alụso gị agha ọzọ.
A ga-ebibi ya kpamkpam.”
2 Onye na-achụsasị ndị mmadụ abịala ịlụso gị* agha.+
Cheenụ ebe ndị a rụsiri ike nche.
Cheenụ ụzọ nche.
Keenụ ájị̀ n’ume.* Gbaakwanụ mbọ ka unu sikwuo ike.
2 N’ihi na Jehova ga-eme ka Jekọb maa mma ọzọ,
Meekwa ka Izrel maa mma ọzọ,
N’ihi na ndị na-ebibi ihe ebibiela ha.+
Ha alaakwala alaka ha n’iyi.
3 E sijiri ọta ndị dike ya ka ha chawa ọbara ọbara.
Ndị agha ya yi uwe na-acha uhie uhie.*
Ígwè a rụnyere n’ụgbọ ịnyịnya agha ya na-egbuke ka ọkụ
N’ụbọchị ọ na-ejikere agha.
A na-efegharịkwa ube ndị e ji osisi junipa pịa.
4 Ụgbọ ịnyịnya agha na-agba ara ara n’okporo ámá.
Ha na-agbagharị n’ámá obodo.
Ha na-enwu ka ọkụ, na-egbukekwa ka àmụ̀mà.
5 Ọ ga-akpọkọta ndị agha ya dị ike.
Ha ga na-akpọ ihe ụkwụ ka ha na-aga.
Ha ga-agaru ná mgbidi ya ọsọ ọsọ.
Ha ga-arụ ihe ga-echebe ha.
7 E kpebiela ya: A gbaala ya ọtọ.
A kpụrụla ya laa. Ndị ohu ya nwaanyị na-ebe ákwá,
Ka ha na-eti aka n’obi. Ákwá ha na-ada ka ubé nduru.
8 Ninive dị ka ọdọ mmiri malite n’ụbọchị o bidoro ịdị.+
Ma ndị mmadụ na-agbazi ọsọ.
“Kwụsịnụ! Kwụsịnụ!”
Ma o nweghị onye na-ele anya n’azụ.+
9 Bukọrọnụ ọlaọcha, bukọrọkwanụ ọlaedo.
Akụ̀ ya enweghị ọgwụgwụ.
O nwere ụdị akụ̀ niile bara ezigbo uru.
10 Obodo tọgbọ nkịtị, tọgbọrọkwa chakoo, e bibiekwala ya.+
Ezigbo ụjọ ji ha. Ikpere ha na-ama jijiji, úkwù ha na-amakwa jijiji.
Ihu ha niile achagharịala.
11 Olee ebe ọgba ọdụm dị,+ ebe ọdụm na-anọ eri nri,
Ebe ọdụm na-edu ụmụ ya aga
N’enweghị onye na-emenye ha ụjọ?
12 Oké ọdụm na-adọrisịrị ụmụ ya anụ ga-ezuru ha.
Ọ na-adọgbutere nne ọdụm anụ.
Ọ na-eme ka anụ ọ dọgburu ju n’ọgba ya,
Ọ na-eme ka anụ ọ dọrisịrị adọrisị ju n’ọgba ya.
13 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ana m emegide gị.+
M ga-agba ụgbọ ịnyịnya agha gị ọkụ, ha akwụọ anwụrụ.+
Mma agha ga-egbuchapụ ọdụm gị niile.
M ga-eme ka a gharazie inwe ndị ga-abụrụ gị anụ oriri n’ụwa.
A gaghịkwa anụ olu ndị ozi gị ọzọ.”+
3 Obodo na-egbu mmadụ* ga-ata ahụhụ.
Aghụghọ na ohi juru na ya.
O nweghị mgbe ọ na-enweghị ndị o ji mere anụ oriri.
2 A na-anụ ụda ụtarị na mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme.
E nwekwara ịnyịnya na-awụ ọsọ na ụgbọ ya na-amali amali.
3 E nwere onye na-agba ịnyịnya nke nọ n’elu ịnyịnya, nweekwa mma agha nke na-egbuke egbuke na ube nke na-egbu maramara.
Ìgwè ndị e gburu egbu na ozu juru ebe niile.
E nweghị ike ịgụta ozu ndị mmadụ ọnụ.
Ha na-akpọ ụkwụ n’ozu ndị nwụrụ anwụ wee daa.
4 Nke a bụ n’ihi ajọ akwụna nwaanyị akwụna na-agba.
Ọ bụ nwaanyị mara ezigbo mma nke na-agba afa.
O ji akwụna ọ na-agba na-amata mba dị iche iche n’ọnyà, jirikwa afa ọ na-agba na-amata ezinụlọ dị iche iche n’ọnyà.
5 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ana m emegide gị.*+
M ga-achịli uwe mwụda gị, jiri ya wụchie gị ihu.
M ga-eme ka mba dị iche iche hụ ọtọ gị,
Meekwa ka alaeze dị iche iche hụ ihere e menyere gị.
6 M ga-ekpokwasị gị ihe rụrụ arụ.
M ga-emekwa ka ị bụrụ ihe a na-asọ oyi.
M ga-emekwa ka a gbaa gị nkiri.+
Ònye ga-emetere ya ebere?’
Ebee ka m ga-achọta ndị ga-akasi gị obi?
8 Ị̀ ka No-emọn* mma?+ Ọ bụ obodo nke dị n’akụkụ ọwa mmiri dị iche iche nke Naịl.+
Mmiri gbara ya gburugburu.
Oké osimiri bụ akụ̀ ya, oké osimiri bụkwa mgbidi ya.
9 Ọ bụ Etiopia na Ijipt mere ka ọ na-akpa ike karịrị akarị.
Pọt+ na ndị Libia nyekwaara ya* aka.+
A kụgburu ụmụ ya n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.*
Ha fekwara nza n’isi ndị ya a na-asọpụrụ.
A tụọkwala ndị ukwu ya niile ịga.
11 Ị ga-aṅụbigakwa mmanya ókè.+
Ị ga-aga zoo.
Ị ga-achọ ebe ị ga-agbaba ka onye iro gị ghara igbu gị.
12 Ebe gị niile a rụsiri ike dị ka osisi fig ndị mkpụrụ mbụ ha charala acha.
Ọ bụrụ na a kwaa ha aka, mkpụrụ ha ga-adanye n’ọnụ onye ga-aracha ha.
13 “Ndị agha gị dị ka ụmụ nwaanyị.
A ga-emeghere ndị iro gị ọnụ ụzọ ámá ala gị.
Ọkụ ga-erepịa ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá gị.
14 Sepụtara onwe gị mmiri maka mgbe ndị agha ga-anọchibido gị.+
Mee ka ebe gị a rụsiri ike sikwuo ike.
Banye n’apịtị, zọọkwa ájá.
Buru ihe e ji akpụ brik.
15 Ọkụ ga-erepịakwa gị ebe ahụ.
A ga-eji mma agha gbuo gị.+
Ha ga-ebibi gị dị ka ụmụ igurube si eripịa ihe.+
Gbaa mbọ ka ị dị ọtụtụ ka ụmụ igurube.
Gbaa mbọ ka ị dị ọtụtụ ka igurube.
16 I meela ka ndị ahịa gị mụbaa karịa kpakpando ndị dị n’eluigwe.
Nwa igurube na-ewe iwere, wee fepụ.
17 Ndị nche gị dị ka igurube.
Ndị agha gị dịkwa ka ìgwè igurube.
N’ụbọchị oyi, ha na-anọ ná mgbidi e ji nkume rụọ.
Ma anwụ chawa, ha efepụ.
O nweghịkwa onye ma ebe ha na-efega.
18 Eze Asiria, ndị na-azụrụ gị atụrụ na-ero ụra.
Ndị gị a ma ama nọ n’ụlọ ha.
A chụsasịala ndị gị n’ugwu.
O nweghịkwa onye na-achịkọta ha.+
19 O nweghị onye ga-enyere gị aka n’oké ọdachi dakwasịrị gị.
Ọnyá na-aba gị agaghị ala ala.
Ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe mere gị ga-akụ aka.+
N’ihi na ò nwere onye na-atabeghị ahụhụ maka na obi tara gị mmiri?”+
Nehọm pụtara “Onye Na-akasi Obi.”
Ma ọ bụ “na-elekọta.”
Na Hibru, “obodo ya.”
Ma ọ bụ “Naanị otu ugboro ezuorola ya ibibi unu.”
Ma ọ bụ “mmanya ọka wit.”
O nwere ike ịbụ, “A ga-alụsokwa ha agha.”
Ya bụ, Juda.
Ya bụ, Asiria.
Ma ọ bụ “n’ụlọikwuu.”
Ya bụ, Ninive.
Na Hibru, “Mee ka úkwù dị ike.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “A ga-agbazekwa obí eze ya.”
Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
Ya bụ, Ninive.
Ya bụ, Tibs.
Na Hibru, “gị.”
Na Hibru, “n’isi okporo ámá niile.”