“Ekele Dịrị Unu Maka Inyere M Aka Ịmụta Banyere Jehova!”
Nke ahụ bụ okwu sitere n’obi nke otu nwa agbọghọ dị afọ 16 si Florida, U.S.A. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara, o dere, sị:
“Apụghị m icheta aha ya, ma agụrụ m akwụkwọ banyere ndụ Jisọs nke obi m na-agwa m na ọ bụ unu bipụtara ya. Tupu m gụọ akwụkwọ ahụ, echere m na m maara ihe nile ọ dị m mkpa ịmara. Ekwere m na Chineke na Jisọs, m na-ekpe ekpere tupu nri abalị nakwa ọzọ n’anyasị, m na-ebikwa ndụ dị nnọọ mma. Ma mgbe m gụsịrị akwụkwọ ahụ, m ghọtara na amaghị m ihe dị ukwuu ma ọlị nakwa na ọ dị m mkpa ịnọgide na-agụ ma na-amụ banyere Jehova Chineke na Jisọs na ndị ọzọ n’ime Bible.
“M ji nwayọọ nwayọọ na-agbanwe ụzọ m ụfọdụ ka m wee bụrụ ohu ka mma nke Chineke. Ma ọ bụghị n’ihi Watch Tower Society, m ka ga-anọ n’ìsì banyere Chineke na akụkọ ndị dị n’ime Bible. Ekele dịrị unu maka inyere m aka ịmụta banyere Jehova!”
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ bụ aha akwụkwọ nwa agbọghọ ahụ na-ezo aka na ya. N’ime ya e mewo mgbalị ịkọ ihe ọ bụla merenụ ná ndụ elu ala nke Jisọs nke e depụtara n’ime Oziọma anọ ahụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmata otú ị pụrụ isi nweta otu ma ọ bụ na ị ga-enwe mmasị ka e duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.