Okwu Ọjọọ, Mmụọ E Gwepịara Egwepịa
“Ejula iberibe!”a Otu nwanyị na Japan na-echeta okwu ndị ahụ nke ọma—a na-agwa ya ha ugboro ugboro mgbe ọ bụ obere nwa. Ònye na-agwa ya? Ọ̀ bụ ụmụ akwụkwọ? Ọ̀ bụ ụmụnne ya? Ee e. Ọ bụ nne na nna ya. Ọ na-echeta, sị: “Ana m enwekarị ịda mbà n’obi n’ihi na ịkọ ọnụ ahụ na-egbu m mmụọ.”
Otu nwoke na United States na-echeta na mgbe ọ bụ nwatakịrị, ọ tụrụ ụjọ ma nwee oké nchegbu mgbe ọ bụla nna ya lọtara. “Ruo taa m ka pụrụ ịnụ ụda taya ya n’ụzọ mbata,” ka ọ na-echeta, “ọ na-emetụkwa m n’ahụ dị ka oké oyi. Nwanne m nwanyị nke nta ga-ezo. Papa m bụ onye na-achọkarị izu okè ma na-akakwasị anyị anya mgbe nile n’ihi emeghị ihe juru ya afọ n’ọrụ ụlọ ndị anyị nwere ịrụ.”
Nwanne nwoke a nke nwanyị na-ekwukwasị: “Adịghị m echeta mgbe ọ bụla nne m ma ọ bụ nna m bitụrụ anyị ọmà, sutụ anyị ọnụ, ma ọ bụ ọbụna kwuo ihe dị ka ‘Ahụrụ m gị n’anya’ ma ọ bụ ‘Eji m gị eme ọnụ.’ Nyekwa nwatakịrị, anụtụghị ‘Ahụrụ m gị n’anya’ na-enwe otu mmetụta ahụ dị ka ‘Akpọrọ m gị asị’—kwa ụbọchị ná ndụ ya.”
ỤFỌDỤ pụrụ ikwu na nsogbu ndị a nwere mgbe ha bụ ụmụaka bụ obere ihe. N’ezie ọ bụghị ihe ọhụrụ ụmụaka ịbụ ndị a na-agwa okwu ọjọọ, ndị na-afụ ụfụ na ndị a na-emeso mmeso ọjọọ. Nke a abụghị ụdị na-apụta n’isi akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ nke akwụkwọ akụkọ na n’ihe ngosi TV ndị na-emetụ n’ahụ. A dịghị ahụ mbibi ahụ anya. Ma ọ bụrụ na ndị nne na nna na-emegbu ụmụ ha n’ụzọ ndị ahụ kwa ụbọchị, ka o sina dị mmetụta ya pụrụ ịdị na-ebibi ihe—ma dịruo ogologo ndụ nile.
Tụlee ihe ọmụmụ e mere na 1990 iji sochie ihe ọmụmụ 1951 nke nyochara usoro nzụlite ndị nne na nna ji mee ihe n’otu ìgwè ụmụaka dị afọ ise. Ndị na-eme nchọpụta jisiri ike chọta ọtụtụ n’ime ụmụaka a, ndị na-akatachabeghị ahụ ugbu a, iji ghọta mmetụta na-adịte anya nke nzụlite ha. Ihe ọmụmụ ọhụrụ ahụ kwubiri na ụmụaka ndị mesịrị nwee nsogbu kasị ukwuu ná ndụ, ndị na-enweghị mmetụta uche dị mma, ndị nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye, ọbụbụenyi, na ọbụna n’ebe ọrụ, abụchaghị ụmụ nke ndị nne na nna dara ogbenye ma ọ bụ nke ndị nne na nna bara ọgaranya ma ọ bụ ọbụna nke ndị nne na nna o doro anya na ha nwere nsogbu. Ha bụ ụmụaka ndị nne na nna ha na-akpaghị nso, na-emesoghịkwa omume enyi ma gosi ntakịrị ma ọ bụ ghara igosi mmetụta ịhụnanya.
Nchọpụta a bụ nanị ntakịrị ngosipụta nke eziokwu e deturu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga: “Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Nkwutọ ma ọ bụ mmetọ n’ụzọ mmetụta uche site n’aka ndị nne na nna na-akpasu ụmụaka iwe n’ezie, ọ pụkwara ime ka obi fuo ha n’ihi ya.
Dị ka akwụkwọ bụ́ Growing Up Sad si kwuo, ọ dịbeghị anya ndị dọkịta chere na e nweghị ihe dị ka ịda mbà n’obi n’oge nwata. Ma oge na ahụmahụ egosiwo na e nwere. Taa, ka ndị na-ede akwụkwọ na-ekwusi ike, a matara ịda mbà n’obi n’oge nwata, ọ bụghịkwa ihe a na-adịghị ahụkebe ma ọlị. Ihe ndị so na-akpata ya bụ ọjụjụ na mmegbu site n’aka ndị nne na nna. Ndị ahụ na-ede akwụkwọ na-akọwa, sị: “N’ọnọdụ ụfọdụ nne ma ọ bụ nna ahụ anọwo na-akatọ ma na-eweda nwatakịrị ahụ ala nke ukwuu mgbe nile. N’ọnọdụ ndị ọzọ e nweghị nnọọ mmekọrịta nke nwatakịrị na nne ma ọ bụ nna ya: nne ma ọ bụ nna adịtụghị ekwupụta ịhụnanya o nwere n’ebe nwatakịrị ahụ nọ. . . . Ihe ọ na-arụpụta na-abụ ọdachi karịsịa nye ụmụaka nke ndị nne na nna dị otú ahụ n’ihi na nye nwatakịrị—ma ọ bụ onye toworo eto, ma e kwuwerị—ịhụnanya yiri anwụ na mmiri nye ihe ọkụkụ.”
Site n’ịhụnanya nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụrụ na e kwupụta ya n’ụzọ doro anya na n’ezoghị ọnụ, ụmụaka na-amụta otu eziokwu dị mkpa: A pụrụ ịhụ ha n’anya; ha bara uru. Ụfọdụ na-aghọtahie echiche a ịbụ otu ụdị nke nganga, ịhụ onwe onye n’anya karịa ndị ọzọ. Ma n’ọnọdụ a, nke ahụ abụghị ihe e bu n’uche. Otu onye na-ede akwụkwọ na-ekwu n’akwụkwọ o dere n’isiokwu ahụ, sị: “Echiche nwa gị banyere onwe ya na-emetụta ụdị ndị enyi ọ na-ahọrọ, otú ya na ndị ọzọ si adị ná mma, ụdị onye ọ ga-alụ, na otú ọ ga-arụpụtaru ihe.” Bible na-ekweta mkpa ọ dị inwe echiche ziri ezi, nke na-agabigaghị ókè banyere onwe onye mgbe o denyere dị ka ihe nke abụọ kachasịnụ n’iwu, sị: ‘Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’—Matiu 22:38, 39.
O siri ike iche na nne ma ọ bụ nna ọ bụla isi zuru okè ga-achọ itipịa ihe dị mkpa ma dị peke peke ka ùgwù onwe onye nke nwatakịrị. Mgbe ahụ, gịnị mere o ji na-emekarị? Oleekwa otú a pụrụ isi gbochie ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na Japanese, noroma baka!