“Ọ Bụ Akwụkwọ Mbụ Ọ Gụtụworo”
Ndịàmà Jehova nọ na Ukraine na-eso ndị na-eche ụgbọ okporo ígwè ekwurịta okwu mgbe mgbe. E nyere otu nwanyị onye gosiri mmasị na Bible otu Akwukwọm nke Akukọ Bible, bụ́ mbipụta nke jiri ọtụtụ ihe osise mee ihe n’akụkọ Bible ya n’usoro ha siri mee.
E mesịa, n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, nwanyị ahụ hụrụ Onyeàmà ahụ ọzọ ma kelee ya maka akwụkwọ ahụ, na-akọwa, sị: “Nwa m nwoke enweghị mmasị ịmụ akwụkwọ ụlọ akwụkwọ ya. Ọ na-esiri ya ike ịgụtụdị ha. Ma mgbe m nyere ya akwụkwọ Akukọ Bible ahụ, ọ hụrụ ihe osise ndị ahụ ma nwee ọchịchọ siri ike ịgụ ya. Ọ gụzuru akwụkwọ ahụ n’ime ihe dị ka izu abụọ. Ọ bụ akwụkwọ mbụ ọ gụtụworo. Ma nke kasịnụ, ọ ṅụrịrị ọṅụ ịbịa mara Chineke. Mụ onwe m kwa, m na-aṅụrị ọṅụ ịhụ mgbanwe ndị a n’ime ya. Biko nyekwuo m akwụkwọ ọzọ ka m gụọ.”
Nwanyị ọzọ guzo nso ebe ahụ ma nụ akụkọ a. Ọ jụrụ ma ọ pụrụ inweta otu Akwukwọm nke Akukọ Bible. Gị onwe gị kwa pụrụ inweta otu akwụkwọ a dị peji 256, ma ọ bụ kwuo ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji soro gị kwurịta abamuru nke ọmụmụ Bible. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.