April 11, 1998—Ụbọchị A Ga-echeta
N’uhuruchi ahụ tupu ọ nwụọ, Jisọs bunyere ndị ozi ya otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu iko mmanya ma nye ha ntụziaka ka ha rie ma ṅụọ. Ọ gwakwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.
N’afọ a ncheta nke ememe a dabara na Saturday, April 11, mgbe anyanwụ dasịrị. Ndịàmà Jehova gbaa ụwa gburugburu ga-ezukọta n’abalị a pụrụ iche iji mee Ememe Ncheta a n’ụzọ Jisọs nyere n’iwu. E ji ikpo ọkụ kasịnụ na-akpọ gị òkù isonyere anyị dị ka onye nkiri. Biko chọpụta n’aka Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị maka kpọmkwem oge na ebe a ga-ezukọ.