‘Ihe Pụrụ Iche’
Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, bụ́ akwụkwọ gbalịrị ịkọ ihe nile mere ná ndụ Jisọs n’elu ala ndị e depụtara n’Oziọma anọ ahụ, otu nwanyị dị afọ 70 nọ na Moscow, Russia, tiri mkpu, sị: “Agụtụbeghị m ụdị akwụkwọ ahụ. Achọrọ m ịmatakwu banyere Chineke na Jisọs Kraịst na ọbụna ịmụ Bible.”
Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia na-enwetakarị ụdị akwụkwọ ozi ahụ banyere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Otu nwanyị nọ na Chelyabinsk, bụ́ otu obodo ukwu nwere ihe karịrị nnọọ otu nde mmadụ, nke dị ihe dị ka kilomita 1,500 n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Moscow, zitere akwụkwọ ozi yiri nke ahụ.
O kwuru banyere Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, sị: “Akwụkwọ ahụ pụrụ iche. Ọ na-akụnye n’ime ndị mmadụ olileanya maka ọdịnihu obi ụtọ ma na-enyere ha aka ịmata banyere akụkọ ihe mere eme oge ochie. Tupu m hụ akwụkwọ a, echetụbeghị m echiche banyere Chineke, ọ dịghịkwa mgbe m nwere mmasị n’okpukpe, ma ugbu a achọrọ m ka e mee m baptism. Achọrọ m ịmụ akwụkwọ unu nke ukwuu. Achọrọ m ịgwa ndị enyi m, ndị m maara, ndị ikwu m, banyere ihe ndị m gụtaworo.”
Gị onwe gị kwa pụrụ inweta akwụkwọ nke pụrụ inyere gị aka ịmụtakwu banyere Jisọs na olileanya ahụ dabeere na Bible nke ndụ n’ime ụwa ọhụrụ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ chọọ ka mmadụ bịa n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị dị na peji nke 5.