Nkà Ọ̀ Na-achọ Omenkà?
Nke ahụ bụ ajụjụ ọtụtụ ndị na-atụgharị n’uche ha taa. Gịnị ka i chere? Otu nwoke si Virginia, U.S.A., dere, sị:
“M ka gụchapụrụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Echere m na e ji nlezianya mee nnyocha ihe ndị e dere na ya, ọ na-akpalikwa iche echiche. Enwetara m akwụkwọ ahụ ọtụtụ afọ gara aga site n’aka otu n’ime ndị ozi ala ọzọ unu nọ na Summerville, South Carolina, U.S.A.
“Enwere m mmasị n’ezie n’akwụkwọ ahụ na mgbachite ọ gbachiteere okike n’ụzọ nkà mmụta sayensị. N’ihi akwụkwọ unu, anakwaghị m eche na ozizi evolushọn bụ eziokwu. Ọ bụ ezie na m bụ onye Roman Katọlik kemgbe ndụ m nile, akwụkwọ a na nkwurịta okwu ndị m so ụfọdụ n’ime ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova unu nwee atọwo m ụtọ.”
Ọ bụrụ na gị onwe gị kwa ga-achọ inweta ihe àmà a pụrụ ịdabere na ya na-egosi na ndụ anọkataghị pụta kama na e kere ya eke, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5. Anyị ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị otú ị pụrụ isi nweta broshuọ ahụ nwere peji dị 32 bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Mụta banyere nkà magburu onwe ya dị n’ihe ndị dị ndụ na ihe mere nkà dị otú ahụ ga-eji chọọ Omenkà.
□ Gwanụ m otú m pụrụ isi nweta broshuọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? □ Biko kpọtụrụnụ m banyere ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Ihe osise nile: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck