E Nyeere Ya Aka n’Ihe Ọ Na-achọ
NDỤ na-esiri ọtụtụ ndị ike n’ụwa nile, ụfọdụ na-achọkwa ihe mere nke a ji dị otú a. Otu nwoke dị afọ 35 nke nwere ụmụ abụọ, si obodo ukwu bụ́ Grodno, dị na Belarus, deta akwụkwọ, sị:
“Otu nwanyị kwụsịrị m n’okporo ámá ma nyefee m magazin Teta! Amaghị m ihe magazin a na-ekwu maka ya, ma ebe ọ bụ na ọ na-adọrọ adọrọ n’ile anya, eweere m ya. Mgbe m larutere ụlọ, elere m isiokwu ndị dị na ya, ha dọkwaara mmasị m.
“Adịghị m ewere onwe m dị ka onye kwere ekwe. Otú ọ dị, achọtara m n’akwụkwọ unu azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha nye ọtụtụ ajụjụ ndị na-enye m nsogbu. Ndụ adịghịrị anyị mfe ugbu a, enyemaka Bible dịkwa anyị mkpa karịsịa. Ọ ga-amasị m ịrịọ unu ka unu zitekwuoro m ihe ọmụma banyere Chineke na ozizi ya. Ruo ogologo oge, achọwo m azịza nye ọtụtụ ajụjụ, akwụkwọ unu enyewokwara m aka n’ihe m na-achọ.”
Akwụkwọ bara uru nke nyewooro ọtụtụ nde aka bụ broshuọ nwere peji dị 32 bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Ị pụrụ inweta ihe ọmụma n’otú ị pụrụ isi nweta otu broshuọ a site n’idejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e depụtara ebe a ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.
□ Biko gwanụ m otú m pụrụ isi nweta broshuọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Kwuo asụsụ nke ọ bụ․
□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.