“Lee Ezigbo Ihe Ọmụma Ọ Bụ!”
Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi nweta nzube ná ndụ, mata otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà, ma ọ bụ mụta isoro ndị mụrụ ha na-emekọrịta ihe n’ụzọ dị mma? Na nso nso a, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Spain natara akwụkwọ ozi, nke na-ekwu ná mkpirikpi, sị:
“Ihe mere m ji na-edegara unu akwụkwọ a bụ iji kelee unu nke ukwuu maka ọrụ ọma unu na-arụ n’ibipụta akwụkwọ ndị magburu onwe ha, dị ka nke a kpọrọ Questions Young People Ask—Answers That Work. Lee ezigbo ihe ọmụma ọ bụ! Ana m ekele ndị dere ma bipụta ya, bụ́ ndị mere ka nrọ ọtụtụ puku ndị na-eto eto mezuo.
“Abụ m nwa agbọghọ dị afọ 21, onye mere nnyocha na Bible ma mụọ ya n’oge gara aga. . . . Ọ dabara nnọọ na m nwetara akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work site n’aka otu enyi m.
“Na mbụ echere m na ọ gaghị enyere m aka, ma nke nta nke nta, m bịara nwekwuo mmasị n’ịgụ ya. O mere ka m chee echiche banyere ọtụtụ ihe, dị ka ihe m kwesịrị iji ndụ m mee, o jikwara nke nta nke nta zaa ajụjụ ndị m nwere. N’ịbụ onye nwere akụ̀ ahụ dị oké ọnụ ahịa, amụtara m otú m ga-esi aghọta ndị mụrụ m, otú e si agbaghara mmehie, na otú e si abụ nwanyị ma na-eme ka nwanyị.”
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị irite uru n’ihe ọmụma ndị dị n’akwụkwọ Young People Ask, ị pụrụ inweta ya site n’idejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e gosiri n’akwụkwọ ahụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.
□ Biko gwanụ m otú m pụrụ isi nweta akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work.
Kwuo asụsụ nke ọ bụ.
□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.