Okwukwe Ya Wusiri Ya Ike
OTU nwata nwanyị dị afọ 17 degaara ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Moldova nke bụ́bu akụkụ nke Soviet Union, akwụkwọ, iji kelee ha maka otu isiokwu pụtara na Teta! nke June 8, 1998. A kpọrọ isiokwu ahụ “Nhọrọ M n’Etiti Nna Abụọ,” ọ kọkwara banyere ahụmahụ onwe onye nke otu onye ntorobia bụ́ onye Armenia.
“Ka m na-agụ isiokwu ahụ,” ka nwata nwanyị ahụ kọwara, “anya mmiri rujuru m anya n’ihi na akụkọ ya yiri nke m.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe m dị afọ 15, amalitere m ịmụ Bible, ndị mụrụ m egbochighịkwa m na mbụ. Ma mgbe m malitere ije nzukọ Ndịàmà Jehova, ha jụwara isi. Mgbe ahụ, na 1997, mgbe m malitere isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ndị m na-amụta, ha gwara m sị: ‘Gakwuru ndị enyị gị Ndịàmà ka ha na-enye gị nri, uwe, ma nye gị ọrụ. Ị bụ nnọọ nwa ọjọọ!’ Ndị mụrụ m nyere m ọbụna ntaramahụhụ site n’iti m ihe, na-ebi m isi n’ahụ ájá.
“Nke ahụ bụụrụ m ule siri ike. Ọtụtụ mgbe ana m enwe mmetụta ndị ahụ onye ntorobịa ahụ bụ́ onye Armenia kwupụtara, bụ́ onye kwuru na ya na-eche mgbe ụfọdụ ma ya na-emekwa ihe na-amasị Jehova. Echere m n’ime onwe m, ‘Ọ̀ bụ na abaghị m uru? Jehova ọ̀ ga-agbaghara m mmehie ndị m mere n’oge gara aga? Jehova ọ̀ ka hụrụ m n’anya?’
“O siri nnọọ ike, karịsịa mgbe m chere na Jehova ahụghịzi m n’anya. Ana m ejikarị anya mmiri akpọku Jehova n’ekpere m ka o nyere m aka, wusie m ike ka ọ ghara ịdị mgbe m ga-ahapụ ya. N’ezie, achọpụtakwara m na Jehova nụrụ ekpere m ma zaa m arịrịọ m. O mere ka m guzosie ike n’ezi ihe, kwụsie ike, ma nwee obi ike. O mere nke a karịsịa site n’Okwu ya, ebe ọbụ abụ ahụ kpọsara n’obi ike, sị: ‘N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.’—Abụ Ọma 27:10.
“Na September 27, 1997, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptism ná mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova na Kagul. Apụrụ m ịhụ nke ọma na Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, na-emezu nkwa ya nke e kwuru banyere ya n’Abụ Ọma 84:11, bụ́: ‘Anyanwụ na ọta ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ: amara na nsọpụrụ ka Jehova ga-enye: Ọ gaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.’
“Ana m ekele onye ntorobia Armenia ahụ nke kọrọ akụkọ ya na-ewusi okwukwe ike na magazin Teta! Enwere m olileanya na ndị mụrụ m na ndị nke ya ga-emesị gosi mmasị n’ozizi nke Bible.”