Ebe Obibi Gị Ọ̀ Dị Nchebe?—Ihe 20 Ị Ga-elebara Anya
“EMECHAALA m rute ụlọ!” Ikekwe i kudara ume mgbe i si ọrụ ụbọchị na-enyeghị gị ohere lọta, na-enwe obi ụtọ na ị nọghị n’ihe ize ndụ n’ebe obibi gị. Ma ị̀ nọ ná nchebe n’ezie? N’ụzọ megidere nke ahụ, ụfọdụ ndị na-anọ n’oké ihe ize ndụ bụ́ nke ha na-amaghị banyere ya n’ụlọ ha. Ndị nwere obere ụmụaka kwesịrị ịkpachara anya nke ọma karịsịa iji belata ọnụ ọgụgụ ihe ọghọm n’ebe obibi ha. N’ịgbaso ihe ndepụta na-esonụ, gịnị ma i leba anya n’ebe obibi gị ma chọpụta mgbanwe ndị dị mkpa ka i mee?
✔ Okooko osisi. Ọ bụrụ na i nwere obere ụmụaka, hụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime okooko osisi gị na-egbu egbu. Cheta, ụmụaka na-amụ ije bụ́ ndị chọrọ ịmata otú ihe dị ga-etinye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla n’ọnụ.
✔ Ákwà nkwụba. Mee ka eriri ákwà nkwụba dịrị n’ebe aka ụmụaka na-agaghị eru. Ha pụrụ ikegide—ọbụnakwa hịgbuo—obere ụmụaka.
✔ Drọwa na kọbọd. Tụlee ịrụnye ha ihe mkpọchi. Nke a ga-egbochi ụmụaka imetụ ihe ndị dị nkọ na ihe ndị dị ize ndụ a na-eji asacha ihe aka.
✔ Stepụ. È tinyere ya ọkụ na-enwu nke ọma ma wepụsịa ihe ndị nọchiri ụzọ? Ị̀ rụnyewo ya ihe mgbochi iji nye aka gbochie ụmụaka na-amụ ije ịdapụ?
✔ Stovu. Weba aka ite na ite ndị e ji eghe ihe n’azụ stovu, karịsịa mgbe ị na-esi ihe.
✔ Ngịga. Na-ehicha ya mgbe nile. Ngịga jupụtara na mmanụ pụrụ ịkpata ọkụ ọgbụgba na kichin.
✔ Ihe e ji agbanyụ ọkụ. Debe ma ọ dịkarịa ala otu n’ụlọ, ma hụ na onye ọ bụla toruworo iji ya eme ihe maara otú e si eji ya eme ihe.
✔ Àkwà ụmụntakịrị. E kwesịrị imechi akụkụ ya nile. Oghere dị n’akụkụ matarasị ekwesịghị ibu ibu nke na isi nwa ọhụrụ pụrụ ịfanye na ya.
✔ Windo. Ihe mgbochi ga-egbochi ụmụaka ịdapụ, onye toro eto pụkwara iwepụ ya ma e nwee ọkụ ọgbụgba.
✔ “Vitamin” na ọgwụ. Debe ihe ndị a na kọbọd a kpọchiri akpọchi ma ọ bụ n’ebe aka ụmụaka na-apụghị iru.
✔ Ọ́kwá ịsa ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-ahapụ obere nwa n’ime ọ́kwá ịsa ahụ n’enweghị onye legidere ya. Obere oge—na obere mmiri—ezuorola nwatakịrị ịbụ onye mmiri gbagburu.
✔ Ovun “microwave.” Cheta na ihe oriri na-adị ọkụ ngwa ngwa n’ime ovun microwave. Ihe ọṅụṅụ nwa ọhụrụ, dị ka ihe atụ, pụrụ ire ya ọkụ ọ bụ ezie na karama ahụ na-ekpotụ nanị ọkụ.
✔ Ovun na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ. Na-elebara ovun gị na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ anya site n’oge ruo n’oge iji chọpụta ma o nwere ebe anwụrụ ọkụ si apụta.
✔ Ekwu ọkụ e ji amịkpọ anụ. Hụ na ụmụaka nọpụrụ anọpụ n’ebe dị mma site n’ebe ekwu ọkụ ahụ e ji amịkpọ anụ dị mgbe ọ dị ọkụ.
✔ Ibo ụzọ ebe ndọba ụgbọala. Gwa ụmụaka ka ọ ghara ịdị mgbe ha ga-agbafe n’okpuru ibo ụzọ ebe ndọba ụgbọala ka a na-emechi ya, karịsịa ma ọ bụrụ na o ji ike eletrik arụ ọrụ.
✔ Ihe mgbàmà anwụrụ ọkụ. Na-edebe ha ọcha, ma na-elebara ha anya mgbe nile. Na-agbanwe batrị ha kwa afọ.
✔ Waya eletrik na ebe ndị a na-akwụnye ngwá eletrik. Tụfuo waya eletrik ndị mebiri emebi. Ọ kasị mma ma ọ bụrụ na ebe ndị a na-akwụnye ngwá eletrik nwere okwuchi.
✔ Ngwá eletrik. Wepụ ngwá eletrik n’ebe ọkwá ịsa ahụ ma ọ bụ ọkwá ịsa ihe dị. Ihe ndị na-egbochi ike eletrik pụrụ ime ka eletrik ghara ịdọ mmadụ.
✔ Ebe a na-edebe ihe ndị ụmụaka ji egwuri egwu. Tinye otu ohere ma ọ bụ abụọ ebe ikuku ga-esi na-abanye n’ebe a na-edebe ihe ndị ụmụaka ji egwuri egwu, tinyekwa ya ihe na-ejide ọnụ ụzọ ya ka ọ ghara ịda n’ike.
✔ Ayọn e ji ede ákwà. Debe ayọn gị e ji ede ákwà—na waya ya na-ayọdata ayọdata—n’ebe aka ụmụaka na-agaghị eru.