Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 11/8 p. 10-11
  • “Mgbe Ụfọdụ Ana M Eche na M Nọ ná Nrọ!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mgbe Ụfọdụ Ana M Eche na M Nọ ná Nrọ!”
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ụwa Ndị Na-anaghị Eme Ihe n’Eziokwu Juru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Anyị Nwetara Enyemaka Chineke
    Teta!—2005
  • Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Hụrụ Eziokwu ahụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2001
g01 11/8 p. 10-11

“Mgbe Ụfọdụ Ana M Eche na M Nọ ná Nrọ!”

Lourdes si na windo ụlọ ha na-elepụ anya n’obodo ukwu ahụ, kpuchie aka n’ọnụ ya na-ama jijiji. Ọ bụ nwanyị Latin America nke hụjuru anya n’aka Alfredo, bụ́ di ya na-eme ihe ike, ruo ihe karịrị afọ 20. A kpaliri Alfredo ime mgbanwe. Ma, ọ ka na-esiri Lourdes ike ikwu banyere ahụ mgbu na ihe mgbu mmetụta uche ndị o diri.

“Ọ malitere nanị izu abụọ anyị gbasịrị akwụkwọ,” ka Lourdes na-ekwu n’olu dị ala. “N’otu oge, ọ kụpụrụ m ezé abụọ n’ọnụ. N’oge ọzọ, ezere m ya, aka ya wee gaa kụrie n’ebe nkowe ákwà anyị. Ma ọ bụ ọnụ ọ na-akọ m na-afụ ụfụ karị. Ọ na-akpọ m ‘ewu iberibe,’ na-emesokwa m dị ka a ga-asị na enweghị m ọgụgụ isi. Achọrọ m ịla, ma olee otú m ga-esi kpọrọ ụmụ atọ laa?”

Alfredo metụrụ Lourdes aka n’ubu n’ụzọ dị nro. “Abụ m onye ọkachamara nọ n’ọkwá dị elu,” ka ọ na-ekwu. “Ihere onwe m mere m mgbe ụlọikpe nyere m akwụkwọ ịkpọ òkù ma nye m iwu ichebe nwunye m. Agbalịrị m ịgbanwe, ma n’oge na-adịghị anya, amalitekwara m ime otú ahụ ọzọ.”

Olee otú ihe si gbanwee? “Otu nwanyị na-anọ n’otu ụlọ ahịa dị n’akụkụ okporo ámá anyị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka Lourdes na-akọwa, bụ́ onye ọ pụtara ìhè na ahụ erutụkwuola ya ala ugbu a. “O kwuru na ya ga-enyere m aka ịghọta Bible. Amụtara m na Jehova Chineke ji ndị inyom kpọrọ ihe. Amalitere m ịga nzukọ Ndịàmà Jehova, n’agbanyeghị na ná mmalite o were Alfredo oké iwe. Ọ bụ ahụmahụ ọhụrụ nye m bụ́ iso ndị enyi m nọkọọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O juru m anya ịhụ na m pụrụ inwe nkwenkwe nke m, na-ekwupụta ha n’enweghị ihe mgbochi, ọbụnakwa na-akụziri ya ndị ọzọ. Aghọtara m na m bara uru n’anya Chineke. Nke a nyere m obi ike.

“E nwere oge oké mgbanwe nke m na-agaghị echefu echefu ma ọlị. Alfredo ka nọ na-aga Mas ndị Katọlik kwa Sunday, ọ nọkwa na-eme mkpesa banyere ihe mụ na Ndịàmà Jehova na-eme. Elere m ya anya ná mkpụrụ anya ma jiri obi ike kwuo n’ụzọ dị jụụ, sị: ‘Alfredo, echiche gị abụghị echiche m.’ Ma o tighị m ihe! N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, e mere m baptism, o tibeghịkwa m ihe ọzọ n’ime afọ ise gaferela kemgbe ahụ.”

Ma mgbanwe ka ukwuu na-abịa. Alfredo na-akọwa, sị: “Ihe dị ka afọ atọ e mesịrị Lourdes baptism, otu onye ọrụ ibe m nke bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọrọ m ịbịa n’ụlọ ya, ọ kọwakwaara m ihe ndị na-akpali mmasị site na Bible. N’agwaghị nwunye m, amalitere m iso ya na-amụ Bible. N’oge na-adịghị anya, amalitere m iso Lourdes na-aga nzukọ. Ọtụtụ n’ime okwu ndị m nụrụ n’ebe ahụ bụ banyere ndụ ezinụlọ, ha na-emekarịkwa m ihere.”

A kpaliri mmasị Alfredo mgbe ọ hụrụ ndị nọ n’ọgbakọ, gụnyere ndị ikom, ka ha na-azacha ala ụlọ mgbe e mechisịrị nzukọ. Mgbe ọ gara n’ebe obibi ha, ọ hụrụ ndị bụ́ di ka ha na-enyere nwunye ha aka ịsa efere. Obere ihe ndị a gosiri Alfredo otú e si egosipụta ezi ịhụnanya.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, e mere Alfredo baptism, ugbu a kwa, ya na nwunye ya na-eje ozi dị ka ndị ozi oge nile. “Ọ na-enyere m aka mgbe mgbe n’ịkwachasị tebụl mgbe e risịrị nri nakwa n’imezi ihe ndina,” ka Lourdes na-ekwu. “Ọ na-aja m mma ma m sie nri, ọ na-enyekwa m ohere ịhọta ihe—dị ka egwú ga-amasị m ige ma ọ bụ ngwá ụlọ ndị anyị ga-azụta. Ihe ndị a ka Alfredo na-agatụghị eme na mbụ! Na nso nso a, na nke mbụ ya, ọ zụtaara m otu ùkwù okooko osisi. Mgbe ụfọdụ ana m eche na m nọ ná nrọ!”

[Foto dị na peeji nke 10]

“Aghọtara m na m bara uru n’anya Chineke. Nke a nyere m obi ike”

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ hụrụ ndị bụ́ di ka ha na-enyere nwunye ha aka ịsa efere

[Foto dị na peeji nke 10]

A kpaliri mmasị Alfredo mgbe ọ hụrụ ndị òtù ọgbakọ, gụnyere ndị ikom, ka ha na-azacha ala ụlọ mgbe e mechisịrị nzukọ

[Foto dị na peeji nke 10]

“N’oge na-adịbeghị anya, na nke mbụ ya, ọ zụtaara m ùkwù okooko osisi”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya