“Azịza Nye Ekpere M”
Otú ahụ ka nne otu nwata nwoke dị afọ itoolu si kọwaa akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, bụ́ nke e wepụtara ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e nwere na Ireland. “O mere ka anya mmiri gbaa m!” ka o kwuru. “Ọ bụụrụ m nnọọ ngọzi, n’ihi na ọ ka bụ n’izu gara aga ka m nọ na-echegbu onwe m n’ihi na amaghị m akwụkwọ nke m ga-eji mụọrọ nwa m ihe.
“Ekpegaara m Jehova ekpere,” ka nwanyị ahụ kọwara, “ka o nyere m aka ịkụziri ya eziokwu Bible ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ụzọ dị mfe nke na-adọrọ mmasị, ma amaghị m ebe m ga-ebido ebido. Ya mere, inweta ọmarịcha akwụkwọ a nke nwere ihe osise ndị mara mma bụ azịza nye ekpere m.”
Otu nne nwere ụmụ ise na California, U.S.A., dere ihe yiri nke ahụ. “Mgbe anyị si n’ala mgbakọ na-alaghachi na họtel anyị,” ka o kwuru, “ahụrụ m ka ụmụ m atọ ndị nke kasị obere nọ na-agụ, na-ekiri, ma na-ekwurịta ihe ndị dọọrọ mmasị ha n’akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.”
O kwuru, sị: “Ọṅụ m nwere mgbe m na-anara onyinye a site n’aka Jehova riri m nnọọ ọnụ—o yiri ọṅụ a na-enwe n’ọmụmụ nwa, n’agbamakwụkwọ, n’ime baptizim, nakwa n’inweta ihe ùgwù site n’aka Onye Okike nke eluigwe na ala. O doro m anya na, mgbe ụfọdụ, anya mmiri nke ọṅụ anyị na-agwa Nna anyị na-ahụ n’anya bụ́ Jehova ihe okwu nkịtị na-apụghị ịgwa ya.”
Ikekwe, ị ga-enwe mmetụta yiri nke ahụ mgbe ị na-enyocha ma na-agụ akwụkwọ a dị peeji 256 nke nwere ọmarịcha ihe osise, bụ́ nke peeji ya hà ka nke magazin a. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.