Site n’Ịbụ Ndị Agha Gaa n’Ịbụ Ndị Na-eme Udo
N Á MBIPỤTA Teta! (Bekee) nke December 8, 2002, a kọrọ ahụmahụ Toshiaki Niwa, bụ́ onye Japan na-akwọ ụgbọelu bụ́ onye e nyere ọzụzụ ime mwakpo a kpọrọ kamikaze n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Niwa kọrọ na n’August 1945, na ya nọ n’otu ọdụ ụgbọelu dị nso na Kyoto na-echere ka e nye ya iwu iburu ụgbọ agha gaa kpọkaa ụgbọ mmiri ndị agha United States, bụ́ nke ga-atakwa isi ya. E nyeghịzi ya iwu ahụ, ebe ọ bụ na nanị ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, agha ahụ biri. Ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, Niwa malitere iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọ mụtara na ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ adịghị ekere òkè n’agha. Ha na-akwanyere mmadụ ibe ha ùgwù n’ezie, n’agbanyeghị ebe ha bi ma ọ bụ mba ha si. (1 Pita 2:17) Niwa, onye bụbu onye agha, bụzi onye na-eme udo nke na-ezi ndị ọzọ ozi nke Okwu Chineke bụ́ nke na-eme ka a dị n’otu.
Akụkọ Niwa metụrụ Russell Werts, nke si United States, n’ahụ́, ebe ọ bụ na ya onwe ya so lụọ agha ahụ—kama ọ kwụnyeere ndị nke ọzọ. “I kwuru na n’August 1945, ị nọ nso Kyoto na-echere ndị mwakpo na-abịanụ,” ka Werts dere n’akwụkwọ ozi o degaara Niwa. “N’otu oge ahụ, anọ m na-enweta ọzụzụ ikpeazụ maka ịga mee mwakpo ahụ. A sị na agha ahụ ebighị mgbe ahụ o biri, ikekwe anyị abụọ gaara anwụwo n’agha ahụ, n’akụkụ nke onye ọ bụla n’ime anyị kwụnyeere. Dị nnọọ ka gị onwe gị na ezinụlọ gị, mụ na nwunye m mesịrị ghọọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịmara na anyị abụọ, bụ́bu ndị iro siri ọnwụ igburịta ibe ha, bụzi ma enyi ma ụmụnna!”
Dị nnọọ ka Toshiaki Niwa na Russell Werts, ọtụtụ ndị bụ́bu ajọ ndị iro na-ebizi ugbu a n’udo nakwa n’ịdị n’otu n’ihi na ha amụwo ma tinye Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ọrụ. N’etiti Ndịàmà Jehova, e nwere ndị Juu na ndị Arab, ndị Armenia na ndị Turkey, ndị Germany na ndị Russia, ndị Hutu na ndị Tutsi, bụ́ ndị na-egosipụta na ha bụ ezi Ndị Kraịst. N’ezie, Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Toshiaki Niwa na Russell Werts n’oge Agha Ụwa nke Abụọ