Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/09 p. 32
  • Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru
  • Teta!—2009
Teta!—2009
g 1/09 p. 32

Ọ Na-enyere Ha Aka Ibi Ndụ Bakwuru Uru

◼ Akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ emetụtala nnọọ ndụ nke ọtụtụ ndị gụrụla ya. Otu nwaanyị kwuru, sị: “Aghọtakwuola m na Jizọs dị adị n’ezie. Ọrụ ya edokwuola m nnọọ anya. Achọrọ m ibi ndụ bakwuru uru ugbu a ma soro na-ekwusa ozi ọma ahụ dị nnọọ ụmụ mmadụ mkpa.”

Otu nna dere, sị: “Akwụkwọ ahụ enyerela m aka ịhụ mkpa ọ dị ịdị na-eṅomi ihe nlereanya zuru okè Jizọs hapụụrụ anyị . . . Akwụkwọ a emeela ka m mụta ịtụgharị uche n’ihe ndị Jizọs kụziri nakwa n’àgwà ndị o nwere mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a—ịdị umeala n’obi, ịhụnanya, inwe nnọọ ndidi, nrubeisi, nakwa ịnọgidesi ike n’ihe. Jizọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya magburu nnọọ onwe ya nke gbarala m ume ịnọgide na-atachi obi.”

Onye ọzọ gụrụ akwụkwọ ahụ kwuru na ya kweere nnọọ ihe e dere n’azụ akwụkwọ ahụ, nke akụkụ ya ụfọdụ kwuru, sị: “Jizọs Kraịst bụ onye ndú nke Chineke nyere anyị, nke dị mmadụ niile mkpa. . . . Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmatakwu Jizọs nke ọma ma sochikwuo ya anya karị.” Onye ahụ kwuziri, sị, “N’eziokwu, akwụkwọ ahụ na-enyere anyị aka ịhụ Jizọs n’anya, inwe okwukwe na ya, na irubere ya isi ma na-eso nzọụkwụ ya.”

Akwụkwọ a bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ nwere peeji 192, iri na atọ n’ime peeji ndị a nwere foto sachiri nke ọ bụla n’ime ha, bụ́ ndị na-egosi ihe dị iche iche Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Baịbụl ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya