Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/15 p. 16
  • ‘Ihe Ncheta Pụrụ Iche’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ihe Ncheta Pụrụ Iche’
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agha
    Teta!—2017
  • Olileanya
    Teta!—2018
  • Ịkpa Ókè Agbụrụ
    Teta!—2014
  • Nkwa Ndị Ga-emezu n’Ọdịnihu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
Teta!—2015
g 1/15 p. 16
Ihe a na-akpọ ụlọ a bụ Hiroshima Peace Memorial ma ọ bụ Genbaku Dome

‘Ihe Ncheta Pụrụ Iche’

N’OBODO a na-akpọ Hiroshima, nke dị na Japan, e nwere osimiri a na-akpọ Osimiri Motoyasu. E nwere otu ụlọ dị n’akụkụ osimiri a. Kemgbe afọ 1945 a tụrụ bọmbụ ebe ahụ, ọ tọgbọ nkịtị. Gịnị mere na a rụzibeghị ụlọ ahụ kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ asaa?

Mgbe a rụrụ ụlọ ahụ bụ n’afọ 1915. E ji brik rụọ ya. Ọ bụ ụlọ elu nwere okpukpu abụọ. E ji ya mere ebe ndị mmadụ na-aga egosi ngwá ahịa ha mepụtara ọhụrụ. Ma, n’abalị isii n’ọnwa asatọ n’afọ 1945, mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere asatọ nke ụtụtụ, njinji jiri. N’ụbọchị ahụ, ngwá agha ọgwụrụ mba a tụrụ n’obodo ahụ gbawara n’ebe na-adịghị anya n’ụlọ ahụ. Ọ bụ ya bụ nke mbụ e ji lụọ agha n’ụwa. Mmadụ niile nọ n’ụlọ ahụ nwụrụ ozugbo nje. Ma, okpokoro ụlọ ahụ adaghị.

Kemgbe ahụ, ndị obodo ahụ agbaala mbọ ka ụlọ ahụ dịkwa otú ahụ ọ dị kemgbe a tụrụ ya bọmbụ. Ngalaba Òtù Mba Ụwa a na-akpọ UNESCO kwuru na ụlọ ahụ na-echetara ndị mmadụ ụdị ike ngwá agha ụmụ mmadụ rụrụ kpara. N’afọ 1996, òtù UNESCO denyere aha ụlọ a n’ebe ha na-edenye aha ihe dị iche iche a na-agaghị echefu echefu n’ụwa. Ha kwuru na ụlọ ahụ na-echetara ha na ha kwesịrị ime ka udo dịrị n’ụwa.

Ma, ụdị ihe a emebeghị ka ndị mmadụ kwụsị ịlụ agha. Ihe na-akpatakwa agha ndị ahụ bụ anyaukwu, ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị okpukpe ọzọ asị ma ọ bụkwanụ mmadụ iburu ihe gbasara obodo ya n’isi. Ọ̀ pụtaziri na agha agaghị akwụsị akwụsị?

Baịbụl kwuru na ọ ga-akwụsị. Abụ Ọma 46:9 sịrị: “[Chineke] na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.” N’oge ahụ, Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ were Alaeze ya dochie ha. Ọ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ “Eze nke ndị eze,” ga na-achịzi ụmụ mmadụ.—Mkpughe 11:15; 19:16.

N’oge ahụ, a gaghịzi enwe ihe ndị ga na-echetara anyị agha ndị a lụrụ n’oge gara aga. Ihe ndị na-agbawa anyị obi ugbu a agaghịzi adị n’ihi na Aịzaya 65:17 kwuru, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya