Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g17 nke 2 p. 12-13
  • Mgbe M Gara Spen

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe M Gara Spen
  • Teta!—2017
Teta!—2017
g17 nke 2 p. 12-13
Toledo bụ obodo ọtụtụ ndị njem na-enwekarị mmasị ịga

Ọtụtụ ihe gbasara akụkọ na omenala Spen jupụtara n’obodo Toledo dị na Spen. N’afọ 1986, aha obodo a banyere n’akwụkwọ dị ka otu n’ime ebe ndị e nwere ihe mgbe ochie n’ụwa. Obodo a sokwa n’ebe ndị njem nlegharị anya na-enwekarị mmasị ịga.

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Spen

Map na-egosi mba Spen

SPEN bụ obodo ọtụtụ ihe dị iche iche dị n’ime ya. Ụdị ndị dị iche iche bi na ya, o nwekwara ma ugwu ma ndịda ma ebe ndị dị larịị. Ihe juru n’ọtụtụ ebe na Spen bụ ọka wit, mkpụrụ vaịn na osisi oliv. N’ebe ndịda Spen, ọ bụ osimiri dị naanị kilomita iri na anọ n’ogologo kewara Spen na Afrịka.

Ndị Finishia, ndị Grik, ndị Katej na ọtụtụ ndị obodo ndị ọzọ bicha na Spen. Mgbe ndị Rom meriri Spen n’agbata afọ 201 na 300 tupu oge Kraịst, ha kpọrọ ya Hispania. E mechara ndị Visigọt na ndị Mọọ abịa biri na ya. Ha webatakwara omenala ha.

Na nso nso a, ihe karịrị nde mmadụ iri isii na asatọ bịara njem nlegharị anya na Spen. Ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji bịa bụ ịnyara anwụ, ịga n’akụkụ mmiri dị iche iche, na ikiri ihe ndị mgbe ochie e ji chọọ obodo ahụ mma. Ọtụtụ ndị na-abịakwa n’ihi nri ndị Spen. Ihe na-adịkarị ná nri ha bụ azụ̀ na ihe ndị ọzọ si n’osimiri, anụ ezi, stuu, salad, na akwụkwọ nri ndị e tinyere mmanụ oliv. A makwa nri ha ndị a na-akpọ, Spanish omelet, paella, na tapas ama n’ụwa niile.

Mariscada bụ otú n’ime nri ndị Spen a na-eji ihe ndị si n’osimiri esi

Otu n’ime nri ha a na-eji ihe ndị si n’osimiri esi bụ Mariskada

Ebe mmadụ abụọ na-agba egwú flamenko

Ndị na-agba egwú flamenko

Ndị Spen na-anabata ndị ọbịa. Ọtụtụ n’ime ha na-asị na ha bụ ndị Katọlik, ma ọ bụ naanị ole na ole n’ime ha na-aga ụka Mas. Na nso nso a, ọtụtụ ndị esila Afrịka, Eshia na Latịn Amerịka gaa Spen gaa biri. Ọtụtụ n’ime ndị a na-enwe mmasị iso ndị ọzọ kwurịta ihe ndị ha kweere. Ndịàmà Jehova na ndị a ekwurịtala ọtụtụ ihe gbasara Baịbụl. Ha esikwala otú a nyere ọtụtụ n’ime ha aka ịmata ihe Baịbụl na-akụzi banyere ihe dị iche iche.

N’afọ 2015, ihe karịrị Ndịàmà Jehova 10,500 wepụtara onwe ha rụọ ma ọ bụ mezie ụlọ ndị ha na-anọ efe Chineke dị iri asaa. A na-akpọ ụlọ ndị a Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ndị obodo nyere ala maka ụfọdụ n’ime ụlọ ndị a. Iji nyere ndị bịara abịa aka irite uru n’ọmụmụ ihe ha, Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ ihe ha n’ihe karịrị asụsụ iri atọ ma e wezụga asụsụ Spanish. N’afọ 2016, ihe karịrị mmadụ 186,000 bịara otu nnọkọ pụrụ iche Ndịàmà Jehova nwere ha ji cheta ọnwụ Jizọs Kraịst.

Ị̀ MAARA?

Spen bụ́ mba kacha emepụta mmanụ oliv n’ụwa niile.

Ugwu a na-akpọ Teide Peak, nke ogo ya dị mita 3,718, bụ ugwu kachanụ na Spen. Ọ dị n’agwaetiti Kanarị. Ọ bụrụ na a tụọ ogo ya bido n’ebe ọ malitere n’ala mmiri ruo n’ọnụ ọnụ ya, ọ bụ ya bụ ugwu nke atọ kacha ogo n’ime ugwu ndị na-agbọpụta ọkụ n’ụwa niile.

  • ASỤSỤ HA: SPANISH, BASK, KATALAN, GALISHIAN, NA VALENSHIAN

  • MMADỤ OLE BI NA YA: 46,439,000

  • ISI OBODO YA: MADRID

  • IHU ÍGWÉ: ANAGHỊ EJI YA N’AKA, MA O KPEGHỊ OKÉ ỌKỤ, YA ATỤWA OKÉ OYI

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya