Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g17 nke 5 p. 14-15
  • Mgbe M Gara Kazakstan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe M Gara Kazakstan
  • Teta!—2017
Teta!—2017
g17 nke 5 p. 14-15
Astana, Kazakstan

Obodo Astana

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Kazakstan

Map mba Kazakstan

NDỊ Kazakstan anaghị ebi otu ebe. Ruokwa taa, ha ka na-achịrị ụmụ anụmanụ ndị ha na-azụ na-aga ebe ọ bụla ahịhịa ndị ha ga-ata dị. N’oge ọkọchị, ha na-anọ n’ebe jụtụrụ oyi, ya bụ, n’ebe ugwu ugwu na-azụ anụmanụ ha. N’oge oyi, ndị Kazakstan na-achịrị ụmụ anụ ha gbadata n’ebe e nwetụrụ okpomọkụ.

E nwekwara ụfọdụ ndị Kazakstan bi n’obodo mepere emepe. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, omenala ha, nri ha, na ihe ndị ha na-emepụta ka na-egosikwa na ndị nna nna ha ochie bụ ndị nkwagharị. Ndị Kazakstan nwekwara ọtụtụ egwu na abụ ndị ha rọrọ ha na-eji ngwá egwu ọdịnala ha na-akụ.

E nwere otu ụlọ ndị obodo a na-arụ a na-akpọ yurt. Ha weere ụlọ a ka ihe na-egosi na mmadụ ji ala obi na ya kpọrọ ihe. Ndị na-azụ anụmanụ ka na-ebi n’ụdị ụlọ a, ma, ndị bi n’obodo mepere emepe na-anọ n’ụlọ a eme ememme ndị pụrụ iche. Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ilegharị anya na Kazakstan na-enwekwa mmasị ibi n’ụlọ a. Onye banye n’ime ụlọ a, ọ ga-ahụ na ụmụ nwaanyị ndị Kazakstan bụ ndị aka siri ike ma a bịa n’ịkpa ákwà, ute na kapet ndị mara mma.

Ebe otu ezinụlọ nọ n’ime ụlọ yurt

Otú ime ụlọ yurt dị

Ndị bi n’ime ime obodo Kazakstan anaghị eji ịnyịnya ha egwuri egwu. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, e nwere aha iri abụọ na otu ndị Kazakstan na-akpọ ịnyịnya, aha nke ọ bụla nwere ihe ọ pụtara. Ihe nke ọ bụla pụtara dịtụkwa iche n’ibe ya. E nwekwara ihe karịrị okwu iri atọ e ji akọwa ụcha akpụkpọ ahụ́ ịnyịnya. Ịnyịnya mara mma na-ada ezigbo ọnụ, bụrụkwa onyinye e ji akpọrọ ihe. N’ime ime obodo, ụmụ nwoke na-amụ ịgba ịnyịnya mgbe ha dị obere.

Anụ na-adịkarị ná nri ndị Kazakstan. Ha anaghị etinyekarị ihe ndị na-eme ka nri tọọ ụtọ na nri ha. Otu n’ime ihe ọṅụṅụ na-amasịkarị ndị Kazakstan bụ koumiss. A na-eji mmiri ara ịnyịnya eme ya. E kwukwara na ọ na-edozi ahụ́. Ihe ọṅụṅụ ọzọ bụ shubat. Ọ na-atọ ka ọ gbatụrụ ụka, na-edozikwa ahụ́. Ọ bụ mmiri ara kamel ka e ji eme ya.

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Almati, na Kazakstan. Ha na-anabatakwa onye ọ bụla chọrọ ịbịa legharịa anya.

Agụ owuru a na-ebi n’ebe snoo dị

A ma agụ owuru a na-ebi n’ebe snoo dị ama maka ịna-ezokarị onwe ya. N’oge ọkọchị, ọ na-agbago n’elu elu ugwu ndị dị na Kazakstan ga nọrọ

Ị̀ MAARA?

Ọ dịkarịa ala ihe dị ka ụdị okooko osisi tulip ọhịa iri atọ na isii na-eto n’ọhịa ndị Kazakstan. Ihe osise okoko osisi a jukwara n’ihe ndị Kazakstan na-emepụta.

Otu osimiri dị na Kazakstan aha ya bụ Balkhash na-atọ nnu nnu n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, ma, n’ebe ndịda ya, ọ fọrọ obere ka nnu ghara ịdị na ya.

A ma ndị obodo a ama maka iji ugo azụrụ azụ achụ nta. Ndị Kazakstan bụ ọká n’ịzụ ugo ndị ahụ na-acha edo edo, ha ejighịkwa ya egwuri egwu ma otu.

Ebe ugo e kere ihe n’isi nọ n’elu aka otu nwoke

Ihe a e ji kechie ugo a anya na-eme ka ọ ghara ịtụ mmadụ ụjọ

  • ASỤSỤ HA: KAZAK NA RỌSHỊAN

  • MMADỤ OLE BI NA YA: 17,563,000

  • ISI OBODO YA: ASTANA

  • IHU IGWÉ: Ọ NA-EKPE ỌKỤ N’OGE ỌKỌCHỊ, NA-ATỤ EZIGBO OYI N’OGE OYI

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya