Mkpụrụ ndụ dị n’ihe na-eko achịcha dị ezigbote ịtụnanya. Ihe dị n’etiti mkpụrụ ndụ nke ọ bụla nwere DNA, ya bụ, ihe na-agwa ya ihe ọ ga na-eme. Mkpụrụ ndụ ndị ahụ nwekwara ihe ndị a haziri nke ọma dị n’ime ha na-agbari ihe ndị ha riri ma mee ka ha dịrị ndụ.
Gịnị Ka Ihe Ndị Dị Ndụ Na-akụziri Anyị?
N’ebe ọ bụla i lere anya n’ụwa, ị ga-ahụ ihe ndị dị ndụ ka ha na-eto ma na-amụba. Ha na-eme ka ụwa anyị a maa mma pụrụ iche. Ụmụ mmadụ amụtakwala ọtụtụ ihe banyere ihe ndị dị ndụ n’oge anyị a karịa n’oge mbụ. Gịnị ka ihe ndị dị ndụ na-akụziri anyị banyere otú ndụ si malite? Legodị ihe ndị a.
Otú ihe ndị dị ndụ si dị ịtụnanya na-egosi na o nwere onye kere ha. Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ọ bụ mkpụrụ ndụ mejupụtara ihe ọ bụla dị ndụ. Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla dị n’ihe dị ndụ na-arụ ọtụtụ ọrụ dị ịtụnanya iji mee ka ihe ahụ dịrị ndụ ma na-emepụtaghachi onwe ya. Ihe a na-eme ma n’ihe ndị buru ibu dị ndụ ma ná ndị nke dị ezigbo ntakịrị. Ka anyị jiri ihe na-eko achịcha mee ihe atụ. Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla dị n’ihe na-eko achịcha dị ezigbo ntakịrị. E jiri ha tụnyere ndị nke dị n’ahụ́ mmadụ, o nwere ike ịdị ka o nweghị ihe ha bụ. Ma, ihe dị n’ime ha dị ezigbo ịtụnanya. Ihe dị n’etiti mkpụrụ ndụ nke ọ bụla nwere DNA, ya bụ, ihe na-agwa ya ihe ọ ga na-eme. Mkpụrụ ndụ ndị ahụ nwekwara ihe ndị dị n’ime ha na-agbari ihe ndị ha riri ma mee ka ha dịrị ndụ. Nri ha gwụ, ha na-ebelata ọrụ ha na-arụ, ya adịzie ka hà na-ehi ụra. N’ihi ya, e nwere ike idowe ihe na-eko achịcha, ya anọọ ogologo oge. Mana, ozugbo e tinyere ya n’achịcha a chọrọ ime ka o koo, ya ebidokwa rụwa ọrụ.
Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ banyere otú ihe a na-eko achịcha si arụ ọrụ ka o nyere ha aka ịghọtakwu otú mkpụrụ ndụ mmadụ si arụ ọrụ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe na-edobeghị ha anya. Otu prọfesọ aha ya bụ Ross King, onye na-akụzi n’otu mahadum dị na Swidin, kwuru, sị: “A chịkọta ndị niile mụrụ banyere ihe ndị dị ndụ, ha agaghị ezu iji chọpụta ihe niile e kwesịrị ịchọpụta iji mata otú mkpụrụ ndụ dị n’ihe na-eko achịcha si arụ ọrụ.”
Gịnị ka i chere? Otú mkpụrụ ndụ dị n’ihe na-eko achịcha si dị ịtụnanya, ọ̀ na-egosi na e nwere onye haziri ya? Ihe dị otú ahụ a haziri nke ọma ọ̀ ga-adị ma ọ bụrụ na e nweghị onye haziri ya?
Ndụ enweghị ike isi n’ihe na-adịghị ndụ pụta. E nwere ọtụtụ ụmụ irighiri ihe e jikọtara ọnụ, ha abụrụ DNA. Mkpụrụ ndụ ọ bụla dị mmadụ n’ahụ́ nwere ụmụ irighiri ihe a ruru ijeri atọ na narị nde abụọ. A haziri ha niile nke ọma ka ha nwee ike ịna-agwa mkpụrụ ndụ otú ọ ga-esi na-emepụta protin na kemikal ndị ọzọ dị mkpa.
Á sịdị na ụmụ irighiri ihe ndị a ejiri aka ha bịakọta ọnụ ijeri kwuru ijeri ugboro, ha agaghị ejili aka ha hazie onwe ha ka ha bụrụ DNA. Ọ gaghị ekwe omume.
Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwebeghị ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara gosiri na ndụ nwere ike isi n’ihe na-adịghị ndụ malite.
Ndụ mmadụ pụrụ iche. Anyị nwere ihe ndị na-eme ka ndụ na-atọ anyị ezigbo ụtọ karịa ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ n’ụwa. Ọ bụ anyị kacha emepụta ihe ndị dị ịtụnanya, anyị na-ahazikwa ihe nke ọma ka anyị na ibe anyị nwee ike ibikọta ọnụ na imekọrịta ihe. Anyị na-egosikwa otú obi dị anyị karịa otú ihe ndị ọzọ dị ndụ si eme. Anyị na-anụ ụtọ ihe, na-anụ ísì, na-anụ ụda, na-ahụkwa ụcha dị iche iche. Anyị mewe ihe, anyị na-eche gbasara ọdịnihu, anyị na-achọkwa ịma ihe mere anyị ji dịrị ndụ n’ụwa a.
Gịnị ka i chere? Ànyị nọkatara mewe ihe ndị a maka na ha ga-eme ka anyị dịrị ndụ ma na-amụba? Ka hà na-egosi na ndụ bụ onyinye Onye kere ihe niile hụrụ anyị n’anya nyere anyị?