Okwu Mmalite
Ọtụtụ ndị anaghịzi akwanyere ndị ọzọ ùgwù. N’ihi ya, ọ na-ejukarị ndị mmadụ anya ma ha hụ ebe mmadụ kwanyeere onye ọzọ ùgwù.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị anaghị akwanyechara ndị mụrụ ha, ndị agadi, ndị uwe ojii, ndị were ha n’ọrụ, nakwa ndị nkụzi ha ùgwù. Ndị mmadụ na-akparịkarị ndị ọzọ n’ebe ndị a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Otu isiokwu gbara na magazin a na-akpọ Harvard Business Review kwuru na otú ndị mmadụ si akparị ndị ọzọ “na-akakwu njọ n’eziokwu.” O kwukwara na ndị mmadụ ‘na-ekwu na nkwanye ùgwù na-ala ka naị.’