Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 114
  • Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Agha Chineke Ga-akwụsị Agha Niile
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Ihe Baịbụl Kwuru Ga-emezu
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 114
Jizọs na ndị agha ya si n’eluigwe nọ n’elu ịnyịnya ọcha

AKỤKỌ NKE 114

Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile

GỊNỊ ka ị na-ahụ n’ebe a? Ọ bụ ụsụụ ndị agha nọkwasịrị n’ịnyịnya ọcha. Ma lee ebe ha si na-abịa. Ha si n’eluigwe na-agbadata! È nwere ịnyịnya n’ezie n’eluigwe?

Ee e, ha abụghị ịnyịnya nkịtị. Anyị maara nke ahụ n’ihi na ịnyịnya apụghị ịgba ọsọ n’igwe ojii, hà pụrụ? Ma Bible na-ekwu banyere ịnyịnya ndị dị n’eluigwe. Ị̀ ma ihe mere o ji na-ekwu nke a?

Ọ bụ n’ihi na e ji ịnyịnya buo ọtụtụ agha n’oge gara aga. N’ihi ya, Bible na-ekwu banyere ndị si n’eluigwe gbara ịnyịnya na-agbadata iji gosi na Chineke ga-ebuso ndị nọ n’ụwa agha. Ị̀ ma ihe a na-akpọ ebe a ga-anọ lụọ agha ahụ? Ọ bụ Amagedọn. Agha ahụ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ niile n’ụwa.

Jizọs ga-abụ Onyeisi n’agha Amagedọn ahụ. Cheta na Jizọs bụ onye Jehova họpụtara ịbụ eze nke ọchịchị Ya. Nke a mere Jizọs ji kpuru okpueze. Mma agha o ji na-egosi na ọ ga-egbu ndị iro niile nke Chineke. Ò kwesịrị iju anyị anya na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile?

Leghachi anya n’Akụkọ nke 10. Gịnị ka ị na-ahụ n’ebe ahụ? Ọ bụ oké iju mmiri ahụ bibiri ndị ajọ mmadụ. Ònye wetara Iju Mmiri ahụ? Ọ bụ Jehova Chineke. Ugbu a, lee anya n’Akụkọ nke 15. Gịnị na-eme n’ebe ahụ? Ọkụ nke Jehova zitere na-ebibi Sọdọm na Gọmọra.

Saghee Akụkọ nke 33. Lee ihe na-eme ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị Ijipt. Ònye mere ka mmiri ahụ rikpuo ha? Ọ bụ Jehova. O mere ya iji chebe ndị ya. Lee anya n’Akụkọ nke 36 na nke 76. Ị ga-ahụ n’ebe ahụ na Jehova kwere ka e bibie ọbụna ndị Izrel bụ́ ndị ya, n’ihi ajọ omume ha.

Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na Jehova ga-ezite ndị agha ya nke eluigwe ịkwụsị ihe ọjọọ niile n’ụwa. Cheedị ihe nke ahụ ga-apụta! Sapeta peeji nke na-esonụ ka anyị lee.

Mkpughe 16:16; 19:11-16.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya