Peeji Mbụ na nke Ndị Bipụtara Akwụkwọ A
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
Ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ n’okpuru “Onyeisi Udo” ahụ bụ kpọmkwem ihe e ji n’aka. Chineke ahụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-eme ka anyị kweta nke a n’amụma banyere ọmụmụ na ọrụ nke “Onyeisi Udo” ahụ n’Aịsaịa 9:6, 7: “A ga-akpọkwa aha ya . . . Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi ya na udo ya ga-agwụ . . . Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” Ụzọ ndị na-agụ akwụkwọ nke a pụrụ isi mee nkwadebe ịbanye n’ịba ụba nke ịchịisi nke “Onyeisi Udo” ahụ ka e setịpụrụ n’ime akwụkwọ a.
—Ndị Bipụtara Ya.
Ọ gwụla ma e gosiri nsụgharị ọzọ, akụkụ Bible ndị e hotara n’akwụkwọ a sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na e mere nsụgharị ahụ site ná Mbipụta Ọhụrụ nke 1984 nke New World Translation of the Holy Scriptures—With References, n’asụsụ Bekee.