“Nọgide n’Ime Ihe Nile Ị Mụtara”
Nke ahụ bụ ihe Pọl onyeozi degaara nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti. (2 Timoti 3:14) Mgbe ị gụsịrị akwụkwọ a, ị matawo banyere ọtụtụ ihe ọma nke Chineke debere maka ndị hụrụ ya n’anya. Ma ọ dị gị mkpa ịnọgide na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka, ma ọ bụrụ na ị ka amalitebeghị inweta enyemaka dị otú ahụ. Nanị degara Ndịàmà Jehova akwụkwọ, na-eji adres kwesịrị ekwesị nke e depụtara n’okpuru, na-arịọ ka e nyekwuo gị ihe ọmụma ma ọ bụ ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bịa n’ụlọ gị ma na-eduziri gị ọmụmụ Bible oge nile n’anaghị gị ego.