NKEBI NKE ATỌ
“Ịhụnanya nke Kraịst Nwere Na-akpali Anyị”
Gịnị na-akpali anyị ịnọgide na-eso Jizọs? Pọl onyeozi zara, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 5:14) Ná nkebi nke a, anyị ga-amụ banyere ịhụnanya Jizọs nwere, ya bụ, ịhụnanya ọ hụrụ Jehova, nke ọ hụrụ mmadụ niile, na nke ọ hụrụ anyị n’otu n’otu. Ịmụ ya ga-akpali anyị n’ezie. Ọ ga-emetụ anyị n’obi, wee kpalie anyị ime ihe, inwe ọganihu n’iso ihe nlereanya nke Nna anyị ukwu.