Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 16 p. 42-p. 43 para. 8
  • Jizọs Egosi na Ofufe Chineke Na-anụ Ya Ọkụ n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Egosi na Ofufe Chineke Na-anụ Ya Ọkụ n’Obi
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ofufe Jehova
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ọrụ Ebube nke Abụọ Jizọs Nọ na Kena Rụọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 16 p. 42-p. 43 para. 8
Mgbe Jizọs na-achụpụ ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ

ISI NKE 16

Jizọs Egosi na Ofufe Chineke Na-anụ Ya Ọkụ n’Obi

JỌN 2:12-22

  • JIZỌS EMEE KA ỤLỌ NSỌ DỊ ỌCHA

Mgbe e mechara agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena, Jizọs gawara Kapaniọm. Nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke, bụ́ Jems, Josef, Saịmọn, na Judas, so ya gaa.

Ma, gịnị mere Jizọs ji gawa Kapaniọm? Obodo a adịghị ebe a na-achọ achọ, o bukwara ibu karịa Nazaret na Kena. Ọtụtụ n’ime ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs bi na Kapaniọm ma ọ bụ n’ebe dị ya nso. N’ihi ya, ọ dịịrị Jizọs mfe ịnọ n’obodo ha nye ha ọzụzụ.

Mgbe Jizọs nọ na Kapaniọm, ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nọ na Kapaniọm na n’obodo ndị gbara ya gburugburu nụrụ ihe ndị o mere na Kapaniọm. Ma, n’oge na-adịghị anya, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ji okpukpe ndị Juu kpọrọ ihe, ga-agawa Jeruselem ime Ememme Ngabiga nke afọ 30.

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, o mere ihe tụrụ ha n’anya nke ha na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ.

A gwara ụmụ Izrel n’Iwu Chineke ka ha jiri ụmụ anụmanụ na-achụ àjà n’ụlọ nsọ. Ndị si esi bịa Jeruselem ga-achọkwa ihe ha ga-eri. N’ihi ya, Iwu ahụ kwuru ka ndị si ebe dị anya bịa Jeruselem were ego ha ga-eji azụ “ehi, atụrụ, ewu” na ihe ndị ọzọ ga-adị ha mkpa n’oge ha ga-anọ na Jeruselem. (Diuterọnọmi 14:24-26) Ọ bụ ya mere ndị ahịa nọ na Jeruselem ji na-ere ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ụmụ nnụnụ n’ime ogige ụlọ nsọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha na-erekwa ihe ndị a oké ọnụ, si otú ahụ na-erigbu ndị ọzọ.

Ezigbo iwe were Jizọs, nke mere ka ọ kwafusịa mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego, kpuo tebụl ha ihu ma chụpụ ha ebe ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Wepụsịanụ ihe ndị a n’ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”—Jọn 2:16.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ihe a merenụ, ha chetara amụma e buru banyere Ọkpara Chineke. Amụma ahụ sịrị: “Ekworo maka ụlọ gị ga-eripịa m.” Ma, ndị Juu jụrụ ya, sị: “Olee ihe ịrịba ama ị ga-egosi anyị, ebe ọ bụ na ị na-eme ihe ndị a?” Jizọs zara ha, sị: “Kụtuonụ ụlọ nsọ a, n’ime ụbọchị atọ, m ga-ewu ya.”—Jọn 2:17-19; Abụ Ọma 69:9.

Ndị Juu ahụ chere na Jizọs na-ekwu banyere ụlọ nsọ ahụ ha nọ na ya. N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “E ji afọ iri anọ na isii wuo ụlọ nsọ a, ị̀ ga-ewu ya n’ime ụbọchị atọ?” (Jọn 2:20) Ma, ụlọ nsọ Jizọs na-ekwu banyere ya bụ ahụ́ ya. Mgbe afọ atọ gachara, ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ndị ahụ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

  • Olee ebe ndị Jizọs gara mgbe e mechara agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena?

  • Olee ihe mere iwe ji wee Jizọs mgbe ọ hụrụ ihe a nọ na-eme n’ụlọ nsọ, gịnịkwa ka o mere?

  • Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị “ụlọ nsọ a,” gịnịkwa ka ihe ahụ o kwuru pụtara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya