Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od p. 179-p. 184
  • Isiokwu Ndị Ọzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ihe Ikpeazụ Ndị Na-aga Ime Baptizim na Ndị Okenye Ga-atụle
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • È Kwesịrị Ime Ndị Na-eto Eto Baptizim?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od p. 179-p. 184

Isiokwu Ndị Ọzọ

Ihe A Chọrọ Ka Ndị Nne na Nna Bụ́ Ndị Kraịst Mee:

Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, o doro anya na ị chọrọ inyere ụmụ gị aka ka ha hụ Jehova n’anya ma nyefee ya onwe ha. Olee otú ị ga-esi nyere ha aka ka ha mee baptizim? Olee mgbe ha ga-eru eru ime baptizim?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Mat. 28:19) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na mmadụ ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst tupu e mee ya baptizim. Nke a pụtara na onye ahụ ga-aghọta ihe Kraịst kụziri, kwere na ha, ma na-emekwa ha eme. Nwatakịrị ga-emelikwa ihe ndị a.

Na-akpa àgwà ọma ka ụmụ gị nwee ike ịmụta ịna-akpa àgwà ọma. Na-akụzikwara ha okwu Jehova otú ọ ga-eru ha n’obi. (Diut. 6:​6-9) Ụzọ ụfọdụ ị ga-esi eme ya bụ iji akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? na akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” kụziere ha ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, jirikwa akwụkwọ ndị a nyere ha aka ka ha na-echebara ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl echiche ma na-ebi ndụ ha otú Baịbụl kwuru. Nyere ụmụ gị aka ka ha nwee ike ịkọwara ndị ọzọ ihe ha na-amụta na Baịbụl. (1 Pita 3:15) Ihe ga-enyere ha aka ka ha nwee ike ruo eruo ime baptizim bụ ihe ndị ha mụtara n’aka gị, ume ị na-agba ha, na ihe ndị ha mụtara mgbe ha na-amụ ihe n’onwe ha nakwa n’ofufe ezinụlọ. Ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị ha mụtara n’ọmụmụ ihe, na iso ndị na-akpa àgwà ọma na-akpa. Nyere ụmụ gị aka ka ha na-eche mgbe niile banyere ihe ha ga-eme ka ha na Jehova na-adịkwu ná mma.

Ilu 20:11 kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” Olee ihe ụfọdụ ga-egosi na nwa gị abụrụla onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ruokwa eruo ime baptizim?

Nwatakịrị chọrọ ime baptizim kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ ya isi. (Ọrụ 5:29; Kọl. 3:20) Baịbụl kwuru banyere Jizọs mgbe ọ dị afọ iri na abụọ na ‘ọ nọ na-edo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya.’ (Luk 2:51) Atụla anya na nwa gị ga-emetacha ihe niile. Ma, nwa chọrọ ka e mee ya baptizim kwesịrị ịbụ onye a ma na ọ na-erubere ndị mụrụ ya isi otú Jizọs mere.

O kwesịkwara igosi na o nwere mmasị ịmụ Baịbụl. (Luk 2:46) Nwa gị ọ̀ na-achọ ịga ọmụmụ ihe na ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe? (Ọma 122:1) Ọ̀ na-agụchi Baịbụl anya ma na-amụchi ihe anya?​—Mat. 4:4.

Nwatakịrị chọrọ ime baptizim ga-agbalị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) Ọ ma na ya kwesịrị ịna-agwa ndị ọzọ ihe o kweere. Ọ na-esi ụzọ dị iche iche anyị si ekwusa ozi ọma ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ihere anaghịkwa eme ya ịgwa ndị nkụzi ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya na ya bụ Onyeàmà Jehova. Ọ na-ejikwa ihe omume e nyere ya n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ akpọrọ ihe.

Ihe ọzọ bụ na ọ ga-agbalị zere mkpakọrịta ọjọọ ka ọ ghara isi otú ahụ kpawa àgwà ọjọọ. (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33) Ihe ndị ga-egosi na ọ na-ezere mkpakọrịta ọjọọ bụ ụdị egwú ọ na-ege, ụdị fim ọ na-ele, ụdị egwuregwu vidio ọ na-egwu, na ụdị ebe ọ na-aga n’Ịntanet.

Ọtụtụ ụmụaka emeela ihe ndị mụrụ ha kụziiri ha ma kpebie na ha ga-efe Jehova, e meekwa ha baptizim mgbe ha ka na-eto eto. Ka Jehova gọzie gị ka ị na-agbalị inyere ụmụ gị aka ka ha mee baptizim, bụ́ ihe dị ezigbo mkpa n’adịm ná mma ha na Jehova.

Ihe A Chọrọ Ka Onye Nkwusa A Na-emebeghị Baptizim Mee:

Obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Mbọ ị gbara bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim dị mma. Okwu Chineke ị na-amụ emeela ka ị mara onye Chineke bụ, meekwa ka i nwee okwukwe na ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere.​—Jọn 17:3; Hib. 11:6.

O nwere ike ịbụ na ị na-agabu chọọchị tupu gị na Ndịàmà Jehova amụwa Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nweghị nke ọ bụla ị gatụrụla. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ihe ọzọ Baịbụl na-akwadoghị ị na-eme n’oge ahụ. Ma ugbu a, okwukwe i nwere emeela ka i chegharịa. Nke a pụtara na ị kwaala ụta maka ihe ndị i mehiere n’oge gara aga. I chigharịakwala, ya bụ, ị hapụla ihe ọjọọ ndị ị na-eme, kpebisizie ike ịna-eme ihe dị Chineke mma.​—Ọrụ 3:19.

Ma, o nwere ike ịbụ na ị‘ malitere n’oge ị bụ nwa ọhụrụ’ mara ihe odide ndị ahụ dị nsọ. Nke a mekwara ka ị ghara ịna-eme ihe Onye Kraịst na-ekwesịghị ime, meekwa ka ị ghara ime mmehie dị oké njọ. (2 Tim. 3:15) Ị mụtakwala otú ị ga-esi jụ ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ gị ma ọ bụ ndị ọzọ na-agwa gị ka i mee. I gosikwala na i nwere okwukwe na Chineke. Otú i si mee ya bụ na ị na-akwado ihe ndị a na-eme ná nzukọ Jehova ma na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ị na-amụta. Ị mụtakwala otú e si ezi ozi ọma. Ugbu a ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, i kpebiela ijere Jehova ozi.

Ma ì bidoro mgbe ị bụ nwata mara onye Jehova bụ ma ọ̀ bụ mgbe i torola eto, o nwere ike ịbụ na ị na-echezi otú ị ga-esi mee ihe abụọ ọzọ dị mkpa, ya bụ, inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim. Otú ị ga-esi enyefe ya onwe gị bụ ịgwa ya n’ekpere na ị ga na-efe naanị ya ruo mgbe ebighị ebi. (Mat. 16:24) Iji gosi na i nyefeela Jehova onwe gị, a ga-eme gị baptizim. (Mat. 28:​19, 20) Otú a i si nyefee Jehova onwe gị na baptizim a ga-eme gị ga-eme ka ị bụrụ onye na-ejere Jehova Chineke ozi. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere ya.

Ihe ndị ị mụtara na Baịbụl emeela ka ị mata na ọnwụnwa dị iche iche nwere ike ịbịara gị. Cheta na obere oge e mechara Jizọs baptizim, ‘mmụọ nsọ duuru ya banye n’ala ịkpa ka Ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.’ (Mat. 4:1) E mechaa gị baptizim, gị abụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst, i kwesịrị ịtụ anya na ọnwụnwa ka ga-abịara gị. (Jọn 15:20) Ha ga-abịakwa n’ụdị dị iche iche. Ndị ezinụlọ unu nwere ike ịna-emegide gị. (Mat. 10:36) Ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị, na ndị enyi gị mbụ nwekwara ike ịna-akwa gị emo. Ya dị otú ahụ, na-echeta ihe Jizọs kwuru na Mak 10:​29, 30. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, ọ dịghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ, nke na-agaghị enweta ugbu a, n’ime oge a, okpukpu otu narị ụlọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ na ubi, tinyere mkpagbu, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.” N’ihi ya, gbalịsie ike ka gị na Jehova na-adị ná mma, na-emekwa ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme.

Ị chọọ ime baptizim, gwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ unu. Gị na ndị okenye ga-atụle ajụjụ ndị na-esonụ ka ha mara ma ì ruru eru ime baptizim. I nwere ike ịna-atụle ha mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị.

Mgbe ị na-akwadebe ajụjụ ndị ahụ gị na ndị okenye ga-atụle, wepụta oge gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara ebe ahụ ma tụgharịa uche na ha. I nwere ike idetu ihe ị ga-aza n’akwụkwọ a ma ọ bụ n’ebe ọzọ. I nwekwara ike mepee akwụkwọ a emepe ma jiri ya na ihe ahụ i deturu na-aza ajụjụ ndị okenye na-ajụ gị. Ọ bụrụ na e nwere ajụjụ ị na-aghọtaghị, gwa onye na-amụrụ gị ihe ka o nyere gị aka ma ọ bụ gị agwa ndị okenye.

Mgbe ị na-aza ndị okenye ajụjụ ndị ahụ, echela na i kwesịrị ime ka azịza gị too ogologo ma ọ bụ sie ike nghọta. Azịza dị mfe i si n’ala ala obi gị zaa kacha mma. Mgbe ị na-aza ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị ahụ, kwuo otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ abụọ i si nweta ihe ị na-aza, iji gosi na ihe ị na-aza si na Baịbụl.

Ọ bụrụ na ị machaghị ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, ndị okenye ga-eme ndokwa ka e nyere gị aka. Nke a ga-eme ka ị ghọta ihe Baịbụl na-akụzi ma si n’ala ala obi gị kwuo ha. Ka oge na-aga, ị ga-eru eru ime baptizim.

[Ihe ndị okenye kwesịrị ime: E depụtara otú unu ga-esi eme ntụleghachi unu na ndị chọrọ ime baptizim na peeji nke 208 ruo 212.]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya