Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 24 p. 62-p. 63 para. 2
  • Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwa Ehi Ọlaedo
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Mozis—Otú Ndụ Ya Si Emetụta Gị
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 24 p. 62-p. 63 para. 2
Ebe ndị Izrel na-agụ egwú ma na-agba egwú gburugburu nwa ehi ọlaedo

ISI NKE 24

Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere

Jehova gwara Mosis, sị: ‘Gbagote n’ugwu ka ị bịakwute m. M ga-ede iwu m ná mbadamba nkume ma nye gị ya.’ Mosis wee gbagoro n’ugwu ahụ ma nọọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Mgbe Mosis nọ n’ugwu ahụ, Jehova dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ ma were ha nye ya.

Ebe Mosis na-atụ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala

Mgbe obere oge gachara, ndị Izrel chere na Mosis ahapụla ha. Ha gwara Erọn, sị: ‘Anyị chọrọ onye ga na-edu anyị. Meere anyị chi.’ Erọn gwara ha, sị: ‘Nyenụ m ọlaedo unu.’ Ọ gbazere ọlaedo ndị ahụ ma jiri ha kpụọ ihe yiri nwa ehi. Ndị Izrel kwuru, sị: ‘Nwa ehi a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.’ Ha malitere ife nwa ehi ọlaedo ahụ. Ha mekwara ememme. Ihe a ha mere, ọ̀ dị njọ? Ee, ọ dị njọ maka na ha ekwela Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Ma ugbu a, ha emezughị nkwa ahụ ha kwere.

Jehova hụrụ ihe na-emenụ ma gwa Mosis, sị: ‘Gbadaa, gakwuru ndị gị. Ha na-enupụrụ m isi ma na-efe chi ọzọ.’ Mosis si n’ugwu ahụ gbadaa, o bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ.

Ka Mosis na-abịaru nso n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, ọ nụrụ egwú ha na-agụ. Ọ hụziri ha ka ha na-agba egwú ma na-akpọrọ nwa ehi ahụ isiala. Mosis were ezigbo iwe ma tụọ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala, ha akụrisịa. Ọ kụriri ihe ahụ yiri nwa ehi ozugbo. Mosis jụziri Erọn, sị: ‘Gịnị ka ndị a gwara gị mere i ji mee ihe ọjọọ a?’ Erọn gwara ya, sị: ‘Ewela iwe. Ị manụ ndị a nke ọma. Ha chọrọ chi ha ga na-efe, ọ bụ ya mere m ji tụba ọlaedo ha n’ọkụ, nwa ehi a apụta.’ Erọn ekwesịghị imere ha chi ahụ. Mosis gaghachiri n’ugwu ahụ ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ndị Izrel.

Jehova gbaghaara ndị ji obi ha chọọ irubere ya isi. Ị̀ hụla ihe mere ndị Izrel kwesịrị iji na-eme ihe Mosis gwara ha?

“Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya, n’ihi na ihe ndị nzuzu anaghị amasị ya. Mezuo nkwa i kwere.”​—Ekliziastis 5:4

Ajụjụ: Gịnị ka ndị Izrel mere mgbe Mosis na-anọghị ya? Gịnị ka Mosis mere mgbe ọ lọtara?

Ọpụpụ 24:12-18; 32:1-30

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya