ISI NKE 33
Rut na Naomi
Mgbe nri kọrọ n’Izrel, otu onye Izrel aha ya bụ Naomi na di ya nakwa ụmụ ha nwoke abụọ kwagara Moab. Di Naomi mechara nwụọ. Ụmụ ha lụrụ Rut na Ọpa. Rut na Ọpa bụ ndị Moab. Ma, ọ dị mwute na ụmụ Naomi mechara nwụọ.
Mgbe Naomi nụrụ na nri adịkwala n’Izrel, o kpebiri ịlaghachi Izrel. Rut na Ọpa sokwa ya. Ma, mgbe ha nọ n’ụzọ na-ala, Naomi gwara ha, sị: ‘Unu hụrụ ụmụ m n’anya, hụkwa mụnwa n’anya. Achọrọ m ka unu lụgharịa di. Laghachinụ Moab.’ Rut na Ọpa gwara ya, sị: ‘Anyị hụrụ gị n’anya. Anyị achọghị ịhapụ gị.’ Ma, Naomi nọ na-agwa ha ka ha lawa. Ọpa mechara lawa, ma Rut ekweghị ala. Naomi gwara Rut, sị: ‘Ọpa alawala ka ọ lakwuru ndị ya na chi ya. Soro ya lawa, laa n’ụlọ nne gị.’ Ma Rut gwara ya, sị: ‘M gaghị ahapụ gị. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.’ Olee otú i chere obi dị Naomi mgbe Rut gwara ya ihe a?
Rut na Naomi rutere Izrel n’oge a malitere iwe ọka bali n’ubi. Otu ụbọchị, Rut gara ka ọ tụtụọ ọka n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz. Boaz bụ nwa Rehab. Ọ nụrụ na Rut bụ onye Moab nakwa na o kweghị ahapụ Naomi maka na ọ hụrụ ya n’anya. Boaz gwara ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha hapụtụ ọka n’ubi ka Rut tụtụọ ha.
Ná mgbede ụbọchị ahụ, Naomi jụrụ Rut, sị: ‘N’ubi ònye ka ị rụrụ ọrụ taa?’ Rut sịrị ya: ‘Ọ bụ n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz.’ Naomi gwara ya, sị: ‘Boaz bụ otu n’ime ndị ikwu di m. Soro ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ubi ya. O nweghị ihe ga-eme gị.’
Rut rụgidere ọrụ n’ubi Boaz ruo mgbe e wechara ihe ubi. Boaz hụrụ na Rut na-arụsi ọrụ ike, bụrụkwa ezigbo nwaanyị. N’oge ahụ, ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, onye ikwu ya ga-alụrụ nwunye ya. Ọ bụ ya mere Boaz ji lụọ Rut. Ha mụtara nwa nwoke aha ya bụ Obed. Obed mechara bụrụ nna nna Eze Devid. Obi tọrọ ndị enyi Naomi ụtọ maka nwa a Rut mụrụ. Ha gwara Naomi, sị: ‘Jehova bu ụzọ nye gị Rut, onye hụrụ gị n’anya. Ugbu a, i nweela nwa nwa. Ka otuto dịrị Jehova.’
“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24