“Olileanya maka Ụwa nke Ka Mma”
Mgbe ọ na-eleta Montreal na July 1985, Gilles Le Sieur hapụrụ akpa pọtfolio ya n’amaghị ama n’ime ụgbọ okporo ígwè nke na-agba n’okpuru ala. N’ụbọchị na-esote mgbe ọ lagbachiri n’ụlọ ya, nke dị ihe dị ka 160 maịlụ [260 kilomita] site na Montreal, otu nwa agbọghọ bụ onye chọtara akpa ahụ kpọrọ ya òkù na telifonu. Gilles na nwunye ya laghachiri Montreal iji nwetaghachi ya. Mgbe ha nwetara ya, ha nyefere nwa agbọgbọ ahụ otu akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Mgbe ihe dị ka izu abụọ gasịrị, ha natara otu leta igosi obi ekele site n’aka ya nke ụfọdụ ihe o kwuru na ya bụ:
“Amaghị m onye n’ime anyị nke jeere ibe ya ozi kanụ n’izu gara aga. Ọ bụ ezie na eleghị m anya inweta ihe nkwụghachi, enwere m obi ụtọ n’obi ekele unu gosiri m. enwere m mmasị karịsịa na unu chọrọ ka mụ na unu kerịta isi iyi nke obi ụtọ unu. . . . Agụsịworị m akwụkwọ ahụ unu nyere m, mgbe unu na-agụkwa leta nke a, otu n’ime ndị enyi m ga na-agụ ya. Unu kwuru eziokwu banyere uru a na-enweta n’akwụkwọ nke a. ọ bụghị nanị na o nyere m olileanya maka ụwa nke ka mma kama ọ zara ọtụtụ ajụjụ ndị okpukpe m na-azabeghị. . . . Amaliteghachiwo m ịgụ Bible, na-enwe ọchịchọ nke ịdị ndụ ka mma ugbu a.”
Nwa agbọghọ nke a nọgidere na-aga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya, mgbe oge na-agakwa, ọ ghọrọ onyeozi oge nile nke ihe ọma ndị ọ mụtara. Akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala arụwo nnọọ ọrụ n’ịgbanwe ọtụtụ mmadụ ibi ndụ ka mma. Akwụkwọ ahu, nke peji ya na magazine nke a hà, fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ kọrọ ihe banyere ozizi nile nke Bible nweekwa ihe karịrị 150 ihe osise ndị e ji ezi ihe. Iji nweta akwụkwọ nke a bara uru nanị dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ nke a na-esonụ.
Biko ziterenụ m, n’anaghị m ego nzite ya, akwụkwọ ahụ e kwesiri mkpo ya ike, nke nwere 256 peji, bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Etinyere m ₦15.