Ime Ihe n’Eziokwu Bụ Ụkpụrụ Kachasị Mma
IME ihe n’eziokwu bụ ihe a jara mma nke ukwu na Bible, ọ bụkwa ihe a chọrọ ezi ndị Kraist n’aka. (Matiu 22:39; 2 Ndị Kọrint 8:21) Ọzọkwa, ime ihe n’eziokwu bụ n’ezie ụkpụrụ kachasi mma, dị ka ọ pụtara ìhè ná ndụ nke ọtụtụ ndị taa bụ́ ndị a gbanweworo uche na obi ha site n’ezi ihe ọmụma Bible. Otu ihe atụ banyere nke a sitere na Liberia.
Mgbe ha mesịworo ntụle dị ukwuu site n’ekpere, otu onye Kraịst bụ okenye na nwunye ya mechiri ụlọ ahịa ebe ha na-akwa ákwà. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-ewekọrọ ihe ka ukwu n’oge ha ma na-egbochi ọrụ ije ozi na ọmụmụ ihe onwe onye ha. Ha kwetara inwe afọ ojuju n’obere ego ha na-enweta site n’ire urì ndị e ji eteji ákwà. Otú ọ dị, ozugbo ha mere nke a, ọnụ ahịa urì gbadara n’ahịa obodo ha. Ego ha na-enweta ugbu a agaghị ezuru ezinụlọ ahụ. Gịnị ka ha ga-eme?
Ha rịọrọ ụlọ ọrụ na-ebunye ha urì ahụ ka ha wetuo ọnụ ahịa ha, wee si otú a na-eme ka o kwe omume ha inweta uru ka ukwuu. Ha jụrụ ime nke a. Otú ọ dị, ụlọ ọrụ ahụ kwetara izite akwụkwo invoice abụọ, otu na-egosi ọnụ ahịa ahụ n’ezie, nke ọzọ na-egosi ọnụ ahịa dị ala nke ha pụrụ igosi ndị ọrụ Custom ka ha wee kwụọ ụtụ dị ala karị. Nke a ga-eme ka onye okenye ahụ nweta $2,000 uru na-ezighi ezi ná ngwá ahịa nke ọ bụla.
Nwanna ahụ jụrụ ikere ọ̀kè n’omume na-ezighị ezi nakwa nke ga-aghọgbu ndị gọọmenti. O juru ndị ịsi ụlọ ọrụ ahụ anya. Ha dere, sị: “Anyị na-akwanyere akọ na uche gị ùgwù,” ha họpụtakwara onye okenye ahụ ịbụ nanị onye na-ere ngwá ahịa ha na Liberia. N’ihi ilekọta mkpa ihe onwunwe na-akpa ezinụlọ ahụ ugbu a n’ụzọ zuru ezu, onye okenye ahụ na nwunye ya enwewo ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, na-esoro ụmụnna na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya iwulite ọgbakọ ha. N’ezie, ha ime ihe n’eziokwu ewetaworo ha ngọzi.
Alfonso, na Spain, chọpụtakwara na ime ihe n’eziokwu bụ ụkpụrụ kachasị mma. Nwatakịrị nke a hapụrụ ụlọ n’oge ọ dị 12 afọ, n’oge na-adịghịkwa anya ọ malitere ire ọgwụ ọjọọ, tinyere iji égbè na-ezu ohi ụgbọ ala, n’ụlọ, na n’ụlọ ahịa dị iche iche. Mgbe ụfọdụ ọ na-eji égbè ezu ohi n’ihe hà ka ụlọ ahịa iri n’otu ụbọchị. N’oge ọ dị 21 afọ, mmadụ anọ n’ime ndị òtù ya tiri ya ihe nke ukwuu, zuru ọgwụ nile o nwere, ma kwuo na ha ga-egbu ya ma ọ bụrụ na o kpee ha n’aka ndị uwe ojii. Ebe ọ bụ na ọ bụ onye ndị uwe ojii maara nke ọma, egwu ekweghị ya ọbụna ka ọ gaa n’ụlọ ọgwụ iji nara ọgwụ.
Ka ọnyá ya ndị ahụ ji nwayọọ na-ala, Alfonso tụgharịrị uche banyere ụzọ ndụ ya n’ụzọ dị omimi. O chetara ihe ndị metụtara ụkpụrụ Bible na ndị Kraist nke nne ya gwaworo ya mgbe ọ bụ nwatakịrị. Mgbe ahụ, o legharawo okwu ya anya, ma ugbu a ọ rịọrọ ka ya soro Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ Bible. N’ime ọnwa isii ọ gbanwewo omume na àgwà ya kpam kpam ma ruo eruo ime baptism.
Otú ọ dị, n’ụbọchị bu ụzọ tupu baptịsm ya, ọ natara otu akwụkwọ ịkpọ òkù ịbịa n’ụlọịkpe ịzara ọnụ ya n’ebubo a na-ebo ya maka iji égbè gaa ohi. Ọ bụ iwu nke ọ daworo n’oge dịworo anya gara aga. Otú o sina dị, Alfonso kwupụtara na ya mere ajọ omume ahụ, a tụbakwara ya n’ụlọ mkpọrọ ịchere mgbe a ga-ekpe ya ịkpe. Onye ọkàiwu na-ekpechitere ya ọnụ ya gbara ya ume ka o kwuo na ọ dịghị ịhe ọ bụla o zuuru, na ọ jighịkwa égbè ọ bụla. Ma Alfonso nọgidere na-ekwu eziokwu. N’ihi ihe ahụ o mere nakwa ajọ aha o nwere n’ebe ndị uwe ojii nọ, onye gbara ya akwụwọ chọrọ ka a tụọ ya mkpọrọ 13 afọ. Ma n’ihi àgwà ọma na ime ihe n’eziokwu ya, a tụrụ ya mkpọrọ ọnwa isii, bụ́ nke ọ nọzuworo n’oge ọ na-echere ka e kpe ya ikpe.
Ugbu a Alfonso na nwunye ya na-eịere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, na-enwe obi ụtọ na ha achọtawo ezi nzube ná ndụ, bụrụkwa ndị e gosipụtaworo site n’ahụmahụ ha na ime ihe n’eziokwu bụ ụkpụrụ kachasị mma.