Ihe omume nke ị na-ekwesịghị ịhapụ
“Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Okwu ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraist kwuru, nke dị na Luk 22:19, bu nke e kwuru n’oge mgbe o guzobere ememe ncheta nke ọnwụ ya. Ọ bụ ọnwụ Jisọs meghere ụzọ nye ihe a kpọrọ mmadụ inweta ndụ ebighị ebi n’ime ọnọdụ nke paradaịs. N’ihi ya, ọnwụ ya bụ ihe anyị na-aghaghị icheta.
ị̀ ga-eme ememe ncheta ya n’afọ a?
Biko zaa òkù a Ndịàmà Jehova na-akpọ gị ka i sonyere ha n’ime ememe ncheta nke ihe omume a dị mkpa. A ga-eme nke a mgbe anyanwụ dasịrị n’ụbọchi kwekọrọ na Naịsan 14 na kalenda Bible nke e ji ọnwa na-agụ. Kaa ụbọchị ahụ akara na kalenda nke gị ka ị ghara ichefu. Ọ bụ April 10, 1990. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị pụrụ ịgwa gị kpọmkwem ebe a ga-anọ mee ya na oge a ga-eme ihe omume a n’ógbè unu.