Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 8-9
  • Ekpere Mmechi n’Ime Ụlọ ahụ Dị n’Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere Mmechi n’Ime Ụlọ ahụ Dị n’Elu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Na-eme Ihe Ị Mụtara n’Ekpere Dị Mkpa Jizọs Kpere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ndụmọdụ O Ji Ahapụ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Ekpere Mmechi n’Ime Ụlọ ahụ Dị n’Elu

N’ỊBỤ onye ịhụnanya dị omimi ọ hụrụ ndị ozi ya kpaliri, Jisọs anọwo na-akwadebe ha maka nhapụ ọ gaje ịhapụ ha n’isi nso. Ugbu a, mgbe o nyesịworo ha ndụmọdụ, kasiekwa ha obi ruo ogologo oge, o weliri anya ya n’eluigwe wee rịọ Nna ya arịrịọ, sị: ‘Nye ọkpara gị otuto, ka ọkpara gị wee nye gị otuto: dị ka i nyere ya ike n’ebe mmadụ nile nọ, ka ihe ọ bụla i nyeworo ya, ka o wee nye ha ndụ ebighị ebi.’

Lee nnọọ isiokwu na-akpali akpali Jisọs na-ewebata n’ebe a—ndụ ebighị ebi! Ebe e nyeworo ya ‘ike n’ebe mmadụ nile nọ,’ Jisọs pụrụ inye ihe nile a kpọrọ mmadụ ndị na-anwụ anwụ abamuru nke àjà mgbapụta ya. Ma, ọ bụ nanị ndị Nna ya nwapụtaworo ka ọ na-enye ‘ndụ ebighị ebi.’ N’ịga n’ihu n’isiokwu a metụtara ndụ ebighị ebi, Jisọs gara n’ihu n’ekpere ya, sị:

‘Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.’ Ee, nzọpụta dabeere n’anyị ịnara ihe ọmụma banyere ma Chineke ma Ọkpara ya. Ma a chọrọ ihe karịrị nanị ihe ọmụma e buru n’isi.

Mmadụ aghaghị ịmara ha n’ụzọ chiri anya, na-ewulite ezi mmekọrịta enyi na enyi n’etiti ya na ha. Mmadụ aghaghị iche echiche dị ka ha si eche n’okwu dị iche iche, hụkwa ihe dị iche iche otú ha si ahụ ha. Karịsịakwa ihe nile, mmadụ aghaghị ịgbalịsi ike iṅomi àgwà ha ndị na-enweghị atụ n’imeso ndị ọzọ ihe.

Jisọs gara n’ihu n’ekpere ya, sị: ‘Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa, ebe m rụzuru ọrụ i nyeworo m ka m rụọ.’ Ebe o siworo otú a rụzuo orụ e kenyere ya ruo ugbu a, na-enwekwa obi ike na ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọdịnihu, ọ rịọrọ arịrịọ, sị: ‘Nna, gị onwe gị werekwa otuto nke m nwere n’ebe ị nọ mgbe ụwa akadịghị nye m otuto ugbu a n’ebe gị onwe gị nọ.’ Ee, ugbu a, ọ na-arịọ ka a kpọghachi ya n’ebube eluigwe o nwere na mbụ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ.

N’ịchịkọta ọrụ bụ isi ọ rụrụ n’elu a|a, Jisọs sịrị: ‘Emere m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa: gị onwe gị nwere ha, i weerekwa ha nye m; ha edebewokwa okwu gị.’ Jisọs jiri aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’ije ozi ya, gosikwa otụ́ kwesịrị ekwesị e si akpọpụta ya, ma o mere ihe karịrị nke ahụ iji mee ka aha Chineke pụta ìhè nye ndị ozi ya. Ọ mụbakwara ihe ọmụma na nghọta ha nwere banyere Jehova, ụdị onye ọ bụ, na nzube ya nile.

N’igosi na Jehova bụ Onye ka ya onwe ya ukwuu, Onye ya onwe ya na-eje ozi n’okpuru ya, Jisọs jiri obi dị umeala kwupụta, sị: ‘Okwu i nyere m ka m nyeworo ha; ha onwe ha wee nara ha, marakwa n’ezie na esi m n’ebe ị nọ pụta, ha kwerekwa na gị onwe gị zitere m.’

N’igosi ọdịiche dị n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ, Jisọs gara n’ihu ikpe ekpere, sị: ‘Ọ bụghị ụwa ka m na-ekpe ekpere banyere ya, kama ana m ekpe ekpere banyere ndị i nyeworo m . . . Mgbe mụ na ha nọrịị, mụ onwe m na-edebe ha . . . echekwara m ha, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ha lara n’iyi, ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyi ahụ,’ bụ́ Judas Iskarịọt. Ka ọ dị mgbe ahụ, Judas nọ na njem ọjọọ ya ịrara Jisọs nye. Otú a, Judas na-emezu Akwụkwọ nsọ n’amaghị ama.

Jisọs gara n’ihu ikpe ekpere, sị: ‘Ụwa kpọkwara ha asị.’ ‘Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha n’ụwa, kama ka i debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.’ Ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ n’ime ụwa, bụ́ usoro ọha ụmụ mmadụ nke Setan na-achị, mana ha dị iche n’ebe ya na ajọ omume ya dị, ha aghaghị ịnọgidekwa otú ahụ.

Jisọs gara n’ihu ịsị, ‘Were eziokwu doo ha nsọ: okwu gị bụ eziokwu.’ N’ebe a, Jisọs kpọrọ Akwụkwọ Nsọ Hibru ahụ, nke o si na ya hota okwu ọtụtụ ugbo, ‘eziokwu.’ Ma ihe o ziri ndị na-eso ụzọ ya na ihe ha mesịrị dee n’okpuru ike mmụọ nsọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụkwa ‘eziokwu.’ Eziokwu nke a pụrụ ido mmadụ nsọ, gbanwee ndụ ya kpam kpam, meekwa ka ọ bụrụ onye dị iche pụọ n’ụwa.

Ugbu a, Jisọs kpere ekpere, ‘ọ bụghị nanị banyere ndị a, kamakwa banyere ndị kweere na [ya] site n’okwu ha.’ Ya mere, Jisọs na-ekpe ekpere banyere ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ nakwa ndị ọzọ ndị gaje ịghọ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu, ndị a ka gaje ịchịkọbata ‘n’otu ìgwè atụrụ.’ Gịnị ka ọ rịọrọ arịrịọ ya banyere ndị a nile? ‘Ka ha nile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị dị n’ime m, dị ka mụ onwe m dịkwa n’ime gị, Nna, . . . ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị onwe anyị bụ otu.’

Jisọs na Nna ya abụghị otu onye n’ụzọ nkịtị, ma ha na-enwe nkwekọrịta n’ihe nile. Jisọs kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee otu ụdị ịdị n’otu ahụ ‘ka ụwa wee mara na gị onwe gị zitere m, na ị hụkwara ha n’anya, dị ka ị hụrụ m n’anya.’

Ugbu a, Jisọs rịọrọ Nna ya nke eluigwe arịrịọ n’isi ndị ahụ gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? ‘Ka, ebe mụ onwe m nọ, ka mụ na ndị ahụ nọọkwa; ka ha wee hụ otuto m, nke i nyeworo m: n’ihi na ị hụrụ m n’anya mgbe a katọghị ntọala ụwa,’ ya bụ, mgbe Adam na Iv tụụrụ ime nwa mbụ ha. Ogologo oge tupu mgbe ahụ, Chineke hụrụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’anya, bụ́ onye mesịrị ghọọ Jisọs Kraịst.

N’imechi ekpere ya, Jisọs kwusikwara ya ike ọzọ, sị: ‘Emekwara m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka ha mara ya; ka ịhụnanya i ji hụ m wee dị n’ime ha, mụ onwe m kwa n’ime ha.’ Nye ndị ozi ahụ, ịmụta aha Chineke agụnyewo ịmara ịhụnanya Chineke n’onwe ha kpọmkwem. Jọn 17:1-26; 10:16; Ilu 8:22, 30.

▪ N’echiche dị aṅaa ka e nyeworo Jisọs ‘ike n’ebe mmadụ nile nọ’?

▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ ịnara ihe ọmụma nke Chineke na nke Ọkpara ya?

▪ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs si mee ka aha Chineke pụta ìhè?

▪ Gịnị bụ ‘eziokwu,’ oleekwa ụzọ o si ‘edo onye Kraịst nsọ’?

▪ Olee ụzọ Chineke, Ọkpara ya, na ndị nile na-efe ezi ofufe si bụrụ otu?

▪ Olee mgbe a ‘tọrọ ntọala ụwa’?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya