Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/1 p. 32
  • Akwụkwọ Nke a Gbanwere Ndụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Nke a Gbanwere Ndụ Ha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/1 p. 32

Akwụkwọ Nke a Gbanwere Ndụ Ha

Ọtụtu afọ gara aga, otu nwanyị gbara di ya alụkwaghịm. E mesịa nwa ya nwoke bu Steve ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Steve nwara n’enweghị ihe ịga nke ọma ịgwa nne ya okwu banyere ihe ndị o kwenyere na ha. Ọ gakwara ịhụ nna ya, bú onye ọrịa cancer na-egbu.

Kama ikwu ọtụtụ okwu, nanị ihe Steve mere bụ ịhapụ akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighi Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’akụkụ àkwà nna ya ma kwuo na ịgụ ya ga-enyere ya aka. Nna ya gụrụ akwụkwọ ahụ wee malite n’onwe ya ịga nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova na January 1988.

N’oge ahụ, nne Steve nwere ohere dị iche iche n’oge nnọkọ ezinụlọ ịhụta àgwà ọhụrụ nke onye bụbu di ya na-egosipụta. Nke a masịrị ya nke ukwuu nke na o kwenyere ịga otu nzukọ Ndịàmà Jehova. Ọ malitere ịga nzukọ nile, mgbe na-adịghịkwa anya ọ na-anọnyere onye ahụ bụbu di ya ná nzukọ ndị ahụ. N‵ikpeazụ ha lụghachiri di na nwunye.

Nna Steve nwụrụ na September 1988 ma ọ bụghị tupu ọ malite ikere òkè n’ozi ndị Kraịst. Nne Steve, bụ́ onye lekọtara nna ya ruo n’ọnwa ndị ikpeazụ nke ọrịa ya, bụ onye e mere baptism na June 1988, ọ bụkwa Onyeàmà na-anu ọkụ n’obi ugbu a.

Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala bụ akwụkwọ nke na-enye olileanya site n’igosipụta azịza ndị Bible na-enye maka nsogbu nile nke ndụ. Ọ bụrụwo ngwá ọrụ e ji gbanwee ndụ ọtụtụ ndị. Nata otu site n’idejupụta na izite mpempe akwụkwọ nke a na-esonụ.

Aga m achọ inata akwụkwọ ahụ e kwesịrị mkpò ya ike nke nwere 256 peji, bụ́ Ị Puru Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. (Degara adres dị n’okpuru akwụkwọ maka ịmatakwu ihe banyere nke a.)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya