Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ọ̀ Bụ Akụkụ nke Ọrụ Oziọma Ahụ?
DỊ KA Joachim Meisner si kwuo, onye bụ bishọp ukwu nke Cologne, onye bụbukwa onye ndú okpukpe a ma ama na East Germany, “ọ bụ ikwu ihe megidere ezi ozizi bụ́ ịkpọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ihe ruru unyi, bụ́ ihe mmadụ na-eji emetọ aka ya.” N’otu ajụjụ ọnụ a gbara ya na 1989, o kwuru, sị: “Ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe dị adị ná ndụ, wee si otú a bụrụ otu akụkụ nke ọrụ oziọma anyị. Anyị aghaghị ịzaghachi ihe ịma aka nke na-eche anyị ihu. N’ụzọ pụtara ìhè, anyị aghaghị imibanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla, site n’òtù ndị ọrụ dị iche iche ruo n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, na-eguzobe n’ime òtù ndị a ntọala nke ihe bụ isi nke metụtara Iso Ụzọ Kraịst nke ndị mmadụ ga-esi n’ime ya pụta wee bịa ibute ụzọ n’ịkwalite ndọrọ ndọrọ ọchịchị Germany na nke Europe.”
Okwu ndị na-esonụ ndị e hotara site n’akwụkwọ akụkọ Frankfurter Allgemeine Zeitung, bụ́ otu akwụkwọ akụkọ a ma ama na Germany, na-egosi na ọtụtụ ndị ndú okpukpe nọ na Europe—ma ndị Katọlik ma ndị Protestant—nwekwara echiche Meisner ahụ.
“Nanị ụbọchị isii mgbe a họpụtasịrị ya [October 1978], ọ [popu ahụ] mara ọkwa na dị ka nwa amaala si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na ya ezubeghị ịnakwere ọnọdụ dị na Europe otú ahụ o si dị. . . . Ụfọdu ndị lere ya anya dị ka okwuchukwu, ma ihe ọ bụ bụ okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”—November 1989.
“N’ebe ụfọdụ [n’ime Czechoslovakia] chọọchị ahụ nwetara nkwado dị ukwuu dị ka ihe butere ụzọ n’ọgba aghara ahụ. Ụmụ akwụkwọ ndị nọ na seminarị ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu dị na Litomĕr̆ice, bụ́ obodo nke dị n’ebe ugwu Bohemia ebe e nwere nnukwu ụlọ katidral, . . . duziri mgbanwe ọchịchị e mere na November gara aga nke a na-emeghị ihe ike ọ bụla na ya.”—March 1990.
“Ekpere ahụ a na-ekpe kwa izu maka udo n’ime Nikolai Church [nke ndị Protestant], bụ́ nke a na-adịghị elebara anya nke ukwuu ruo afọ iri, ghọrọ ihe àmà na mberede n’ime afọ ọgba aghara nke a, bụ́ afọ mgbe e nwere mgbanwe ọchịchị e ji udo mee na GDR [German Democratic Republic]. . . . Ọtụtụ ndị ụkọchukwu a na-apụghị ịgụta ọnụ na ndị aghasa chọọchị na-ekere òkè mgbe mgbe ná njegharị iwe ndị e mere mgbe nke ahụ gasịrị.”—December 1989.
N’ajụjụ ọnụ ahụ a gbara ya, Archbishop Meisner kwukwara, sị: “Anyị apụghị ichere ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ndị Kristian si n’elu daa. . . . Ọ dịghị mgbe ọ bụla ike na-agwụ m ịgba ndị Kristian ka na-eto eto ume . . . ka ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, [ma ọ bụ ike adịghị agwụkwa m] . . . ịgwa ụmụ amaala toworo eto, sị: Unu ekwesịghị ịgbachi nkịtị ka ntụliaka gafere n’etinyeghị aka na ya.”
N’ụzọ kwekọrọ na nke a, mmadụ 19 ndị so na Volkskammer (ụlọ nzukọ ndị ome iwu) nke East Germany, bụ́ ndị e ji ntụliaka webata n’ọkwá na March 1990, bụ ndị ụkọchukwu. A nọchitekwara anya okpukpe nke ọma ná ndị so na-achị achị. Akwụkwọ akụkọ bụ Nassauer Tageblatt dere banyere otu n’ime ndị ụkọchukwu ya atọ, onye Minista Okwu Nchebe Mba dị n’aka, bụ́ Rainer Eppelmann, bụ́ onye kwupụtaworo na ya bụ onye na-achọ udo, sị: “Ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka otu n’ime ndị bụ nna nke mgbanwe ọchịchị ahụ e ji udo mee.”
Ndịàmà Jehova nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ narị puku na-enwe ọṅụ ná nnwere onwe okpukpe ka ukwuu ha nwere ugbu a. Ma ha adịghị eji ya eme ihe itinye aka n’esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke ọha mmadụ. N’ikwekọ n’ọrụ oziọma ahụ nke e kwuru okwu ya na Matiu 24:14, ha na-agbaso ihe nlereanya Jisọs nke ịgbakụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ mmadụ azụ, ma n’otu oge ahụ jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere. Ndị ndú okpukpe Krisendọm—ma ọ̀ bụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ—ga-eme nke ọma imekwa otú ahụ.—Jọn 6:15; 17:16; 18:36; Jemes 4:4.