Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ịkpọsa “Ọhịha Gwa Ndị A Dọtara n’Agha” na Brazil
MMỤỌ Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ahụ ndị ya na Brazil ka ha nọ na-ekwusa ozi ọma nke ntọhapụ nye ndị nọ n’agbụ nke okpukpe ụgha. (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:18) Na 1947, e nwere nanị 648 Ndịàmà ná mba ahụ. Na 1967, ọnụ ọgụgụ ha agbagowo ruo 41,548. Site ná ngọzi Jehova, ná mmalite 1991, o ruwo ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị 302,000! N’eziokwu, ‘Chineke mere ka o too.’ (1 Ndị Kọrint 3:7) N’afọ ije ozi 1990 nanị, e mere 27,068 mmadụ baptism.
Ito uto dị otú ahụ mere ka ọ dị mkpa iguzobe otu sekit ọhụrụ kwa izu, a raarakwara 150 Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ nye n’ime nanị otu afọ. Karịsịa, alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe ahụ zụtara ala dị 450 eka iji wusaa ụlọ ebe obibi akwụkwọ ha, ebe ha na-ebipụta Bible ugbu a n’ígwè ndị nke ha. Otú a, Ndịàmà nọ na Brazil na-arụsi ọrụ ike inyere ndị dị umeala n’obi aka isi na “Babilọn Ukwu ahụ” pụta tupu ‘oké mkpagbu ahụ’ abịa.—Mkpughe 7:9, 10, 14; 18:2, 4.
□ Otu onye nkwusa gbara afọ asatọ tinyere otu akwụkwọ n’aka nwunye onye isi ndị uwe ojii, mgbe ahụkwa, nanị ya jere nletaghachi. Nzube ya bụ ime ka nwanyị ahụ gụọrọ ya ụfọdụ n’ime akụkọ ndị ahụ ma gwa ya ka ọ kọọ ihe ọ ghọtaworo site na nke ọ bụla n’ime ha. Ka nwanyị ahụ na-akọwara ya akụkọ ndị ahụ, ya bụ nwanyị malitere inwe mmasị n’akwụkwọ ahụ wee gwa nwata ahụ ka o mee ka ya na nne ya mata. Nwata ahụ mere otú ahụ, ugbu a, nwanyị ahụ na-enwe ọmụmụ Bible ebe obibi mgbe nile.
□ Na 1984, ike gwụrụ Maria n’ihi ihu abụọ ọ hụtara n’etiti ọha mmadụ, o nwekwara obi nkoropụ n’ihi oké ihe ọdachi ndị ọ na-agụ na-eme n’ụwa. Ya mere ọ malitere ịgbaso ụzọ ndụ nnupụisi nke ndị punk. Ọ sịrị: “Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ imegide ihe nile na mmadụ nile. Otú m si ejike bụ nanị iji mee ka ibubo nwụọ ndị mmadụ n’ahụ—uwe ndị a na-ahazighị nke ọma, ndị dị oji, isi a kpụchara nanị otu akụkụ. Elefuuru m di m, ụmụ m, na ụlọ m anya wee malite ise wii wii na iji ọgwụ ọjọọ bụ cocaine eme ihe iji gbanarị ihe ndị na-eme eme. Ma nke a mere ka m nwee mmetụta dị njọ karị. Akwara m ákwá. Mgbe m gụrụ Bible, aghọtaghị m ihe ọ bụla. Ya mere ekpere m ekpere maka enyemaka Chineke.
“Otu ụbọchị, Ndịàmà abụọ bịara n’ụlọ m, mgbe anyị kparịtasịrị ụka ruo nwa mgbe, ha nyere m magazin abụọ. Mgbe m na-asapesị otu n’ime ha, ahụtara m otu isiokwu bụ ‘Adabereghị na Chineke—N’ihi Gịnị?’a Isiokwu ahụ metụrụ m n’obi. Enwere m mmetụta nke bụ na Chineke azawo ekpere m, kpọmkwem n’ụbọchị ahụkwa, Ndịàmà ahụ malitere iduziri m ọmụmụ Bible. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, emere m mgbanwe ndị meziwanyere ndụ m. Di m na ezinụlọ m megidere ọmụmụ Bible m ná mmalite, ma, ka ha hụrụ mgbanwe ndị m na-eme, ha malitere ịgba m ume. Abụ m ohu Chineke nke meworo baptism ugbu a.”
Ndịàmà Jehova nọ na Brazil, dịkwa ka ndị nọ n’akụkụ nile ọzọ nke ụwa, na-arụsi ọrụ ike n’ịkpọsa “ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha.” Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-aza òkù ahụ, na-achọta ezi ntọhapụ na obi ụtọ n’ijere Jehova ozi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mbipụta July 1, 1986, nke Ụlọ Nche.
[Igbe dị na peeji nke 30]
BRAZIL
Ọnụ Ọgụgụ - 150,367,800
1990 Ọnụ Ọgụgụ Ndị Nkwusa Kasị Elu - 293,466
Nkezi, 1 Onye Nkwusa maka - 512
1990 Ndị E Mere Baptism - 27,068
Nkezi Ndị Ọsụ Ụzọ - 30,115
Ọnụ Ọgụgụ Ọgbakọ - 4,625
Nkezi Ọmụmụ Bible - 341,305
Ndị Bịara Ememe Ncheta - 790,926