‘Ha Na-achịbu Ọchị’
Otu nwoke bụ onye agha na Hungary kwuru na n’oge na-adịbeghị anya gara aga, ndị mmadụ na-achịbu ndị na-ekwu okwu banyere Bible ọchị. Ma oge agbanwewo. Onye soja ahụ degaara ọfis Watch Tower Society dị na Budapest akwụkwọ n’oge na-adịghị anya gara aga, na-asị:
“N’ụbọchị ole na ole gara aga, agụrụ m akwụkwọ unu ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Otu onye gbazinyere m ya ka m jide ruo mgbe m gụchara ya. Ihe e dere n’akwụkwọ ahụ enwewo mmetụta dị omimi n’ahụ m, o mewokwa ka m chee echiche.” Onye soja ahụ chọrọ inweta Bible na ihe ọmụma ndị ọzọ. Mmeghachi omume dị otú ahụ abụkwaghị ihe a na-adịghị ahụkebe n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe.
Otu akwụkwọ ozi ọzọ a natara n’ọfis ahụ dị na Budapest na-asị: “Agụwo m akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Akwụkwọ ahụ enwewo mmetụta dị nnọọ omimi n’ahụ m, ya mere ọ masịrị m idere unu akwụkwọ ịrịọ ka otu Onyeàmà bịa n’ụlọ m ka m wee nwee ike ịdị na-enwe ọmụmụ Bible mgbe nile.”
Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala bụ akwụkwọ nke na-enye olileanya site n’iduru gị gaa n’azịza ndị dị na Bible. Ọ bụwo ihe enyemaka n’ime ka ọtụtụ ndị gbanwee ndụ ha. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta ya, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ ya na ihe odide a so.
Ọ ga-amasị m inweta akwụkwọ ahụ nwere 256 peji nke e kwesiri mkpo ya ike, bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. (Degara adres dị n’okpuru ebe a akwụkwọ iji mata ihe banyere nke a.)
[Foto dị na peeji nke 32]
Ọ bụ ezigbo ihe mere onye mụrụ nwa ga-eji kwere ka a waa nwa ya ọ hụrụ n’anya ahụ nke na-afụ ụfụ. Chineke nwekwara ezigbo ihe mere o ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ahụ ahụhụ ruo nwa mgbe