Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/15 p. 32
  • Ọkụ Ọgbụgba Akpalie Owuwu Ụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọkụ Ọgbụgba Akpalie Owuwu Ụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/15 p. 32

Ọkụ Ọgbụgba Akpalie Owuwu Ụlọ

“ỌKỤ! ọkụ! Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova na-agba ọkụ!” E tiri mkpu ahụ na-ebu isi n’otu ehihie Friday nke October 1989 na Heerenveen bụ́ otu obodo ukwu dị ná mpaghara ugwu nke Netherlands.

Ndịàmà Jehova ejiwo Ụlọ Mgbakọ nke a mee ihe ruo 11 afọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ngwụcha izu ọ bụla, ọtụtụ narị mmadụ na-ezukọta n’ebe ahụ maka mgbakọ sekit abalị abụọ ma ọ bụ otu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Ọ bụwo ebe dị mma maka ntụziaka Bible.

Otu ihe ọghọm mere ka ọrụ ịkpuchi elu ụlọ ahụ nọ na-aga n’ihu. Ka ọ na-erule minit ole na ole, ihe ọghọm ahụ emewo ka ụlọ ahu ghọọ mkpọ mkpọ ebe na-adakasị adakasị. Otú ọ dị, ọ bụ ihe ikele ekele na ọ dịghị onye merụrụ ahụ.

N’inwe mwute n’ihi mfu ahụ ma n’enweghị obi nkoropụ, Ndịàmà ahụ mere atụmatụ dị iche iche maka ụlọ ọhụrụ n’akụkụ ebe ọzọ. Ha chọtara ebe kwesịrị ekwesị na Swifterbant, nke dị ná mpaghara Flevoland. Nke a bụ nkukoro ala buru ibu nke dị n’ime obodo bụbu Zuider Zee, nke ji 16 amaụkwụ dị ala karị elu mmiri.

Ka ọ na-erule January 1991 a mara ọkwa ka amalite iwu Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ. A ga-ewusị ya n’agbata May na September 1991. Ọtụtụ narị Ndịàmà nyere onwe ha n’afọ ofufo ịrụ ọrụ n’ebe a, ndị ikom na-eto eto hụtakwara ihe owuwu ahụ dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ n’ijere Jehova Chineke ozi oge nile. Ọtụtụ ndị ọrụ bịara site Belgium na England.

E wuru otu ihe owuwu mara mma. E ji otu paseji e ji glas kpuchite elu ya kewapụ ebe ndị mmadụ na-anọdụ ala na ebe a na-anọ eri nri. Ime ụlọ ahụ na-abata 1,008 ndị mmadụ nọdụrụ ala, 230 ndị ọzọkwa pụrụ ikiri ihe omume ahụ n’ihu telivishọn dị n’ahụ ụlọ dị n’akụkụ.

Taa, ọtụtụ puku ndị mmadụ na-asị: ‘Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Jehova, ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ.’ (Aịsaịa 2:2, 3) Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ nke a bụ nnọọ nanị otu n’ime ọtụtụ ebe a na-enye nduzi ime mmụọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ebe i bi bụkwa nke ọzọ. Ị ga-enwetakwa nnabata na-ekpo ọkụ n’ebe ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya