Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/1 p. 30-31
  • Ndị Kraịst Mbụ Hà Jiri Aha Chineke Mee Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Kraịst Mbụ Hà Jiri Aha Chineke Mee Ihe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/1 p. 30-31

Ndị Kraịst Mbụ Hà Jiri Aha Chineke Mee Ihe?

AHA Chineke pụtara ọtụtụ puku ugbo n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ebe e ji mgbochi ume anọ ahụ bụ́ יהוה (YHWH, Tetragrammaton) nọchite anya ya. Ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala na-atụ aro na n’Israel tupu a dọta ya n’agha, tupu 607 T.O.A., a na-eji aha ahụ eme ihe n’ebe nile, n’ime akwụkwọ Bible nke Ezra, Nehemaịa, Daniel, na Malakaị, bụ́ ndị e dere mgbe a lọtasịrị site ná ndọta n’agha, ọ pụtakwara ọtụtụ ugbo. Otú ọ dị, nwayọọ nwayọọ ka oge maka mpụta Mesaịa na-eru nso, ndị Juu lara azụ n’iji aha ahụ eme ihe n’ihi nkwenkwe ụgha.

Ndị na-eso ụzọ Jisọs hà jiri aha Chineke (nke a na-edekarị “Jehovah,” ma ọ bụ “Yahweh” n’asụsụ Bekee) mee ihe? Ihe àmà na-aza ee. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpegara Chineke ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) N’ọgwụgwụ nke ozi elu ala ya kwa, ya onwe ya kpere ekpere nye Nna ya nke eluigwe, sị: “Emere m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa.” (Jọn 17:6) E wepụkwa nke ahụ, ihe odide ndị mbụ nke Septuagint, nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ndị na-eso ụzọ Jisọs jiri mee ihe, nwere aha Chineke n’ụdị Tetragrammaton Hibru ahụ.

Gịnị banyere Oziọma ndị ahụ na ihe fọdụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (“Agba Ọhụrụ”)? E chewo na ebe ọ bụ na aha Chineke pụtara na Septuagint, ọ gaara apụtakwa n’ihe odide ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ ndị a—ma ọ dịghị ihe ọzọ ebe e hotara Septuagint. Otú a, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị 200 ugbo n’ime New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Ndị ụfọdụ akatọwo nke a dị ka nke na-ezighị ezi. Otú ọ dị, o yiri ka e nwere ihe mgbakwasị ụkwụ maka New World Translation n’ebe a na-atụghị anya ịhụ ya: Talmud nke Babilọn.

A kpọrọ akụkụ mbụ nke akwụkwọ okpukpe nke a nke ndị Juu Shabbath (Ụbọchị Izu Ike), o nwekwara ọtụtụ ụkpụrụ nduzi na-achịkwa omume ndị a ga-eme n’Ụbọchị Izu Ike. N’otu nkebi, e nwere ntụle ma ò ziri ezi ịzọpụta ihe odide Bible n’ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike, mgbe ahụkwa akụkụ okwu na-esonụ apụta: “E kwuru n’ihe odide ahụ, sị: Oghere ndị a na-edeghị ihe [gil·yoh·nimʹ] na Akwụkwọ nile nke ndị Minim, o nwere ike anyị agaghị azọpụta ha site n’ọkụ. R. Jose kwuru, sị: N’ụbọchị nkịtị nile nke izu, mmadụ ga-achapụ Aha Chineke ndị ahụ ha nwere, zoo ha, ma suo ihe fọdụrụ n’ọkụ. R. Tarfon kwuru, sị: Ka m lie nwa m ma ọ bụrụ na m gaghị esu ha na Aha Chineke ha ọkụ ma ọ bụrụ na ha abata m n’aka.”—Nsụgharị sitere n’aka Dr. H. Freedman.

Olee ndị bụ ndị mi·nimʹ? Okwu ahụ pụtara “ndị na-arọ òtù,” ọ pụkwara izo aka n’ebe ndị Sadusii ma ọ bụ ndị Sameria dị. Ma dị ka Dr. Freedman si kwuo, n’akụkụ okwu nke a o yikarịsịrị ka ọ̀ na-ezo aka n’ebe ndị Juu bụ́ ndị Kraịst nọ. Ya mere, gịnị bụ gil·yoh·nimʹ ndị ahụ, bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “oghere ndị a na-edeghị ihe” dị ka Dr. Freedman si dee ya? Ọ dị ihe abụọ o nwere ike ịpụta. Ha pụrụ ịbụ akụkụ a na-edeghị ihe nke akwụkwọ mpịakọta ma ọ bụ ọbụna akwụkwọ mpịakọta ndị a na-edeghị ihe ọ bụla. Ma ọ bụ—n’iji okwu ahụ mee ihe n’ụzọ ịkwa emo—ha nwere ike ịbụ ihe odide nile nke ndị mi·nimʹ, dị ka à na-ekwu na ihe odide ndị a bụ ihe na-abaghị n’ihe dị ka akwụkwọ mpịakọta a na-edeghị ihe na ha ma ọlị. N’ime akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche a na-enye nkọwa nke abụọ a dị ka “Oziọma.” N’ikwekọ na nke a, ahịrị okwu ahụ nke pụtara na Talmud tupu akụkụ ahụ e hotara n’elu na-agụ, sị: “Akwụkwọ dị iche iche nke ndị Minim dị ka oghere ndị a na-edeghị ihe na ha [gil·yoh·nimʹ].”

Ya mere, n’akwụkwọ bụ́ Who Was a Jew? nke Lawrence H. Schiffman dere, a sụgharịrị akụkụ Talmud ahụ e hotara n’elu n’ụzọ dị otú a: “Anyị adịghị azọpụta Oziọma ndị ahụ na akwụkwọ nile nke ndị minim (‘ndị jụrụ ozizi’) site n’ọkụ (n’Ụbọchị Izu Ike). Kama nke ahụ, a na-esu ha ọkụ n’ebe ha nọ, ha na Tetragrammata ha. Rabbi Yose Ha-Gelili na-ekwu, sị: N’ime izu, mmadụ kwesịrị ịchapụta Tetragrammata dị na ha ma zopụ ha ma suo ihe fọdụrụ n’ọkụ. Rabbi Tarfon kwuru, sị: Ka m lie ụmụ m ndị ikom! Ọ bụrụ na (akwụkwọ ndị a) ga-abata m n’aka, m ga-esukọta ha na Tetragrammata ha n’ọkụ.” Dr. Schiffman gara n’ihu ịrụ ụka na ndị mi·nim n’ebe a bụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst.

Akụkụ nke a nke Talmud ọ̀ na-ekwu okwu n’ezie banyere ndị Juu bụ́ ndị Kraịst mbụ? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ọ bụ ihe àmà siri ike na ndị Kraịst tinyere aha Chineke, Tetragrammaton ahụ, n’Oziọma na ihe odide ha dị iche iche. O yikwara nke ukwuu na Talmud na-ekwu banyere ndị Kraịst bụ ndị Juu n’ebe a. E nwere nkwado ndị ọkà mmụta akwụkwọ maka echiche dị otú ahụ, n’ime Talmud ahụkwa, okwu ndị gbara gburugburu yiri ka hà na-enyekwu nkwado. Akụkụ na-eso nhota okwu ahụ dị n’elu nke sitere na Shabbath na-akọ akụkọ metụtara Gameliel na onye ikpe bụ onye Kraịst nke ọ bụ n’ime ya ka e zoro aka n’akụkụ ụfọdụ nke Ozizi Elu Ugwu ahụ.

Ọ bụ nanị n’ikpeazụ, mgbe Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ siri n’ozizi ndị dị mfe Jisọs ziri pụọ, ka ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst kwụsịrị iji aha Chineke na-eme ihe, ọbụnakwa bụrụ nke e wepụrụ site mbipụtaghachi dị iche iche nke Septuagint na site n’Oziọma ndị ahụ na akwụkwọ Bible ndị ọzọ.

[Foto dị na peeji nke 31]

N’ụbọchị Jisọs, aha Chineke dị n’ime “Septuagint”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Israel Antiquities Authority

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya