Aha Chineke
“Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” Otú ahụ ka okwu Latin a na-agụ. Okwu ndị ahụ dabeere n’Abụ Ọma 127:1 n’ime Bible, ha bụkwa eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: Mgbalị ọ bụla nke na-enweghị ngọzi Jehova ga-emesịa bụrụ na nkịtị.
Okwu ahụ, nke e dere n’afọ 1780, ka a na-achọta n’ụlọ dị na Colombo, Sri Lanka, ọ dịkwa ịrịba ama n’ihi na o nwere aha Chineke, bụ́ Jehova na ya. (Lee foto.) Na narị afọ ndị bu ụzọ e jiri aha ahụ mee ihe nke ukwuu. A na-edekwasịkarị ya n’ụlọ ndị ọchịchị, chọọchị, ọbụna n’elu mkpụrụ ego. Ndị ozi ala ọzọ jiri aha Chineke mee ihe mgbe ha wegara Bible n’ala ndị dị anya, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ya kpatara okwu nke a e dekwasịrị n’elu ụlọ na Sri Lanka.
Lee ka ihe si dị iche taa! Ole na ole ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na-echegbu onwe ha banyere aha Chineke. Ụfọdụ ndị mmụta ọbụna na-akatọ Ndịàmà Jehova maka ikwusi okwu ike banyere ya. N’ihi gịnị? Dị ka ụfọdụ na-ekwu, n’ihi na a maghị kpọmkwem ụzọ e si akpọ ya na Hibru. Ma ọ̀ bụ mmadụ ole maara ụzọ e si akpọ aha Jisọs na Hibru mbụ? Ma, a na-eji aha ya eme ihe n’ebe nile, na-akwanyekwara ya ùgwù.
Nye Jisọs, aha Chineke dị oké mkpa. Ọ kụziiri anyị ikpe ekpere sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Kpọmkwem kwa tupu ọnwụ ya, ọ gwara Chineke, sị: “Emere m ka aha Gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa.” (Jọn 17:6) Ezi ndị Kraịst bụ ndị na-agbaso ije ụkwụ Jisọs. Ọ̀ bụ na ha ekwesịghịkwa ‘ime ka a mara aha Chineke’? Ndịàmà Jehova na-eme otú ahụ, Jehova na-agọzikwa “ụlọ” ha n’ụba. Nye ha, abụ ọma ahụ bụ eziokwu: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15.